Igbo of Nigeria

Jọn

Jọn 1

1 Na mbu ka Okwu ahu diri, Okwu ahu na Chineke dikwara, Okwu ahu buru kwa Chineke. 2 Onye ahu na Chineke diri na mbu. 3 Ekère ihe nile site n'aka-Ya; ekèghi kwa otù ihe ọ bula nke ekèworo ma Ọ nọghi ya. 4 Nime Ya ka ndu diri; ndu ahu buru kwa Ìhè nke madu. 5 Ìhè ahu we nāmu n'ọchichiri; ọchichiri ahu ejideghi kwa ya. 6 Otù nwoke putara, onye ezitere site n'ebe Chineke nọ, aha-ya bu Jọn. 7 Onye ahu biara ib͕a àmà, ka o we b͕ara Ìhè ahu àmà, ka madu nile we site n'aka-ya kwere. 8 Ya onwè-ya abughi Ìhè ahu, kama ọ biara ka o we b͕ara Ìhè ahu àmà. 9 Ezi Ìhè ahu diri, Nke nēnye madu ọ bula nke nābia nime uwa ìhè. 10 Ọ nọri n'uwa, ekèkwara uwa site n'aka-Ya, uwa amaghi kwa Ya. 11 Ọ biakutere ihe nke aka Ya, ma ndi nke aka Ya akpọbataghi Ya. 12 Ma ka ha ra, bú ndi nara Ya, ha ka O nyere ike ighọ umu Chineke, bú ndi kwere n'aha-Ya: 13 ndi amuru, ọ bughi site n'ọbara, ọ bughi kwa site n'ọchichọ anu-aru, ọ bughi kwa site n'ọchichọ nwoke, kama site na Chineke. 14 Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n'etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa-nwoke amuru nání ya nānata n'aka nna-ya), O juputara n'amara na ezi-okwu. 15 Jọn nāb͕ara Ya àmà, nēti kwa nkpu, si, Onye a bu Onye m'kwuru okwu bayere Ya, si, Onye ahu Nke nābia n'azum aghọwo Onye burum uzọ: n'ihi na Ọ buri Onye mbu n'ebe m'nọ. 16 N'ihi na site na njuputa-Ya ka ayi onwe-ayi nile natara, ọbuná amara nēsochi amara. 17 N'ihi na esitere n'aka Moses nye iwu Chineke; amara na ezi-okwu sitere n'aka Jisus Kraist bia. 18 Ọ dighi onye ọ bula huworo Chineke mb͕e ọ bula; Chineke, bú Ọkpara amuru nání Ya, Onye nādabere n'obì Nna-Ya, Onye ahu kọrọ Ya nye madu. 19 Nka bu kwa àmà Jọn, mb͕e ndi-Ju siri na Jerusalem zigara ya ndi-nchu-àjà na ndi Livai ka ha jua ya, si, Gì onwe-gi bu onye? 20 O we kwuputa, ọ gọghi kwa agọ; ma o kwuputara, si, Mu onwem abughi Kraist ahu. 21 Ha we jua ya, si, Ì bu gini kwa? Gì onwe-gi bu Elaija? Ọ si, Abughi m. Gì onwe-gi bu onye-amuma ahu? O we za, si, É-è. 22 Ya mere ha siri ya, Ì bu onye? ka ayi we nye ndi zitere ayi ihe-ọziza. Ì si gini bayere onwe-gi? 23 Ọ siri, Mu onwem bu olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si, Menu uzọ Onye-nwe-ayi ka o guzozie ike, dika Aisaia onye-amuma kwuru. 24 Ma ufọdu nime ha ka ezitereri site n'etiti ndi-Farisi. 25 Ha we jua ya, si ya, Ọ̀ bu kwa gini mere i nēme baptism, ma ọ buru na gi onwe-gi abughi Kraist ahu, ma i bughi Elaija, ma i bughi onye-amuma ahu? 26 Jọn zara ha, si, Mu onwem nēji miri me baptism: n'etiti unu ka otù Onye nēguzo Nke unu onwe-unu nāmataghi, 27 bú Onye ahu Nke nābia n'azum, Onye mu onwem nēkwesighi itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya. 28 Emere ihe ndia na Betani n'ofè Jọdan, ebe Jọn nēme baptism. 29 N'echi-ya ọ hu Jisus ka Ọ nābiakute ya, o we si, Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa! 30 Onye a bu Onye mu onwem kwuru okwu bayere Ya, si, Otù Nwoke nābia n'azum Onye ghọworo Onye burum uzọ: n'ihi na Ọ buri Onye mbu n'ebe m'nọ. 31 Mu onwem amaghi kwa Ya; ma ka eme Ya ka Ọ puta ìhè nye Israel, n'ihi nka ka mu onwem biara nēji miri eme baptism. 32 Jọn we b͕a àmà, si, Ekiriwom Mọ Nsọ ka O si n'elu-igwe nēfeda ka nduru; O we nọgide n'aru Ya. 33 Mu onwem amaghi kwa Ya: ma Onye ziterem ka m'were miri me baptism, Onye ahu sirim, Onye ọ bula i gāhu Mọ Nsọ ka Ọ nēfedakwasi Ya, nānọgide kwa n'aru Ya, Onye ahu bu Onye nēji Mọ Nsọ eme baptism. 34 Mu onwem ahuwo kwa, b͕a kwa àmà na Onye a bu Ọkpara Chineke. 35 Ọzọ n'echi-ya Jọn guzoro, ya na madu abua nime ndi nēso uzọ-ya; 36 o we le Jisus anya ka Ọ nējeghari, ọ si, Le, Nwa-aturu Chineke! 37 Madu abua ahu ndi nēso uzọ-ya we nu ka ọ nēkwu, ha we so Jisus. 38 Jisus we chigharia, kiri ha ka ha nēso Ya, Ọ si ha, Gini ka unu nāchọ? Ha we si Ya, Rabai (nke isi-ya bu, ma asugharia ya, Onye-ozizí), òle ebe I bi? 39 Ọ si ha, Bianu, unu gāhu kwa. Ya mere ha biara hu ebe O biri; ha na Ya we nọgide ubọchi ahu; ọ di ka oge hour nke-iri. 40 Otù nime madu abua ahu ndi nuru okwu si n'ọnu Jọn puta, ndi so-kwa-ra Ya, bu Andru, nwa-nne Saimon. 41 Onye ahu buru uzọ chọta nwa-nne nke aka ya, bú Saimon, si ya, Ayi ahuwo Mesaia-ayi (nke bu, ma asugharia ya, Kraist). 42 O duru ya biakute Jisus. Jisus lere ya anya, si, Gi onwe-gi bu Saimon nwa Jọn: agākpọ gi onwe-gi Kifas (nke bu Pita, ma asugharia ya). 43 N'echi-ya Ọ chọrọ ipu ga Galili, O we hu Filip: Jisus we si ya, Som. 44 Ma Filip bu onye Betsaida, onye si n'obodo Andru na Pita puta. 45 Filip we chọta Nataniel, si ya, Ayi ahuwo Onye Moses dere ihe bayere Ya n'akwukwọ iwu, Onye ndi-amuma dekwara ihe bayere Ya, Jisus Onye Nazaret, Nwa Josef. 46 Nataniel we si ya, Ọ̀ di ezi ihe ọ bula puru isi na Nazaret puta? Filip si ya, Bia le. 47 Jisus huru Nataniel ka ọ nābiakute Ya, O we kwue okwu bayere ya, si, Le, onye Israel n'ezie, onye aghughọ nādighi ya n'aru! 48 Nataniel si Ya, Òle ebe I maram? Jisus zara, si ya, Mb͕e Filip akākpọghi gi, mb͕e i nọ n'okpuru osisi fig, ahurum gi. 49 Nataniel zara Ya, si, Rabai, Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke; Gi onwe-gi bu Eze Israel. 50 Jisus zara, si ya, N'ihi na M'siri gi, Ahurum i n'okpuru osisi fig, ì kwere ekwe? i gāhu ihe kariri ihe ndia uku. 51 Ọ si kwa ya, N'ezie, asim unu, Unu gāhu elu-igwe ka emegheworo ya, hu kwa ndi-mọ-ozi nke Chineke ka ha nārigo nārida kwa n'aru Nwa nke madu.

Jọn 2

1 N'ubọchi nke-atọ ọlulu-nwunye di na Kena nke Galili; nne Jisus nọ kwa n'ebe ahu: 2 ewe kpọ kwa Jisus, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, bia n'ọlulu-nwunye ahu. 3 Mb͕e manya-vine kọrọ, nne Jisus we si Ya, Ha enweghi manya-vine. 4 Jisus we si ya, Nwanyi, gini ka Mu na gi nwekọrọ? oge hour nkem akābiarughi. 5 Nne-Ya si ndi nēje ozi, Ihe ọ bula Ọ si unu me, menu ya. 6 Ma adọbara n'ebe ahu ite nkume miri isi, dika ime-ọcha nke ndi-Ju si di, nānagide firkin abua ma-ọbu atọ n'otù. 7 Jisus si ha, Were miri b͕ajue ite-miri ndia. Ha we b͕ajupu ha n'ọnu. 8 O we si ha, Kuputanu ub͕u a, bugara onye-isi oriri. Ha we būru ya. 9 Ma mb͕e onye-isi oriri ahu deturu miri ahu ọnu nke ghọrọri manya-vine, ma ọ mataghi ebe o si puta (ma ndi nēje ozi ndi kuputarari miri ahu mara), onye-isi oriri ahu we kpọ onye nālu nwunye ọhu, 10 si ya, Onye ọ bula nēbu uzọ adọba manya-vine ọma; mb͕e ọ bula madu ṅubigasiri manya ókè o we dọba nke jọkariri njọ: gi onwe-gi edebewo manya-vine ọma rue ub͕u a. 11 Jisus mere nmalite ihe-iriba-ama-Ya nile nka na Kena nke Galili, we me ka ebube-Ya puta ìhè; ndi nēso uzọ-Ya we kwere na Ya. 12 Mb͕e ihe a gasiri Ọ ridara na Kapanaum, Ya onwe-ya, na nne-Ya, na umu-nne-Ya, na ndi nēso uzọ-Ya: ha we nọgide n'ebe ahu ọ bughi ọtutu ubọchi. 13 Ememe ngabiga nke ndi-Ju we di nso, Jisus we rigoro Jerusalem. 14 Ọ we hu n'ulo uku Chineke ndi nēre ehi na aturu na nduru, na ndi nāb͕anwe ego ka ha nọduru ala: 15 O we chiri udọ̀ me utari, we chupu ha nile n'ulo uku Chineke, ma aturu ma ehi ahu; Ọ wusì ego ndi nāb͕anwe ego, kpù kwa table-ha iru; 16 Ọ si ndi nēre nduru, Chipunu ihe ndi a n'ebe a; unu emela ulo Nnam ka ọ buru ulo ahia. 17 Ndi nēso uzọ-Ya chetara na edere ya-ri n'akwukwọ nsọ, si, Ekworo ulo-Gi gēripiam. 18 Ya mere ndi-Ju zara, si Ya, Ọ̀ bu ihe-iriba-ama gini ka I nēgosi ayi, ebe I nēme ihe ndia? 19 Jisus zara, si ha, Kwatuenu ulo nsọ a, n'ubọchi atọ M'gēweli kwa ya elu. 20 Ya mere ndi-Ju siri, Ọgu arọ abua na isi ka eji wu ulo nsọ a, Gì onwe-gi gēweli kwa ya n'ubọchi atọ? 21 Ma Ya onwe-ya nēkwu okwu bayere ulo nsọ nke bu aru-Ya. 22 Ya mere mb͕e emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ndi nēso uzọ-Ya chetara na O kwuru okwu a; ha we kwere ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ya na okwu Jisus kwuru. 23 Ma mb͕e Ọ nọ na Jerusalem n'ememe ngabiga, n'ememe ahu, ọtutu madu kwere n'aha-Ya, n'ihi na ha nāhu ihe-iriba-ama-Ya nile nke Ọ nēme. 24 Ma Jisus onwe-ya araraghi Onwe-ya nye n'aka-ha na ntukwasi-obi, n'ihi na Ọ mara madu nile, 25 ya na n'ihi na ọ dighi Ya nkpà ka onye ọ bula b͕ara madu àmà; n'ihi na Ya onwe-ya mara ihe di nime madu.

Jọn 3

1 Ma otù nwoke nime ndi-Farisi di aha-ya bu Nikọdimọs, otù onye-isi nke ndi-Ju: 2 Onye ahu biakutere Ya n'abali, si Ya, Rabai, ayi matara na I bu onye-ozizí Nke siworo n'ebe Chineke nọ bia: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula puru ime ihe-iriba-ama ndia nke Gi onwe-gi nēme, ma ọ buru na Chineke anọyeghi ya. 3 Jisus zara, si ya, N'ezie, n'ezie, asi mi, Ọ buru na amughi madu ọzọ, ọ pughi ihu ala-eze Chineke anya. 4 Nikọdimọs we si ya, Èsi aṅa pu imu madu mb͕e ọ kara nká? ọ̀ puru ibà n'afọ nne-ya nke ub͕ò abua, ewe mua ya? 5 Jisus zara, N'ezie, n'ezie, asim i, Ọ buru na amughi madu site na miri na Mọ Nsọ, ọ pughi ibà n'ala-eze Chineke. 6 Nke amuworo site n'anu-aru bu anu-aru; nke amuwo-kwa-ra site na Mọ Nsọ bu mọ. 7 Ka ọ ghara iju gi anya na M'siri gi, Aghaghi imu unu ọzọ. 8 Ifufe nēfe ebe ọ nāchọ, i nānu kwa olu-ya, ma i mataghi ebe o si bia, na ebe ọ nāga: otú a ka onye ọ bula amuworo site na Mọ Nsọ di. 9 Nikọdimọs zara, si Ya, Ìhe ndia si aṅa pu ime? 10 Jisus zara, si ya, Gì onwe-gi bu onye-ozizí Israel, ma i maghi ihe ndia? 11 N'ezie, n'ezie, asim i, Ayi nēkwu ihe ayi matara, ayi nāb͕a kwa àmà ihe ayi huru; ma unu anaraghi àmà-ayi. 12 Ọ buru na agwaram unu ihe nke uwa, ma unu ekweghi, ùnu gēsi aṅa kwere, ma ọ buru na agwam unu ihe nke elu-igwe? 13 Ọ dighi kwa onye ọ bula rigoworo n'elu-igwe, ma-ọbughi Onye siri n'elu-igwe ridata, bú Nwa nke madu. 14 Ma dika Moses weliri agwọ n'ọhia, ọbuná otú a aghaghi iweli Nwa nke madu elu: 15 ka onye ọ bula nke kwere we nwe ndu ebighi-ebi na Ya. 16 N'ihi na Chineke huru uwa n'anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n'iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi. 17 N'ihi na Chineke eziteghi Ọkpara-Ya n'uwa ka O kpe uwa ikpé; kama ka ewe site n'aka-Ya zọputa uwa. 18 Ekpeghi onye kwere na Ya ikpé: ekpewo onye nēkweghi na Ya ikpé ub͕u a, n'ihi na o kweghi n'aha nke Ọkpara Chineke muru nání Ya. 19 Ma nka bu ikpé ahu, na Ìhè ahu abiawo n'uwa, ma madu huru ọchichiri n'anya kama Ìhè ahu; n'ihi na ọlu-ha jọrọ njọ. 20 N'ihi na onye ọ bula nke nēme ihe nādighi nma nākpọ Ìhè ahu asì, ọ dighi-abiakute kwa Ìhè ahu, ka aghara itu ya ọlu-ya nile n'anya. 21 Ma onye nēme ihe bu ezi-okwu nābiakute Ìhè ahu, ka ewe me ka ọlu-ya puta ìhè, na aluworo ha na Chineke. 22 Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus na ndi nēso uzọ-Ya biara n'ala Judia; n'ebe ahu ka Ya na ha nānọgide, Ọ nēme kwa baptism. 23 Jọn nēme kwa baptism n'Inon nke di Selem nso, n'ihi na miri riri nne n'ebe ahu: ha we nābia, anēme kwa ha baptism. 24 N'ihi na akātubàghi Jọn n'ulo-nkpọrọ. 25 Ya mere iju-ajuju putara n'etiti ndi nēso uzọ Jọn na onye-Ju banyere ime-ọcha. 26 Ha we biakute Jọn, si ya, Rabai, Onye gi na Ya nọ n'ofè Jọdan, Onye gi onwe-gi b͕aworo àmà nye Ya, le, Onye ahu nēme baptism, madu nile nābiakute kwa Ya. 27 Jọn zara, si, Madu apughi inata ihe ọ bula, ọ buru na eweghi ya nye ya site n'elu-igwe. 28 Unu onwe-unu nāb͕aram àmà, na m'siri, Mu onwem abughi Kraist ahu, kama, na ezitewom n'iru Ya. 29 Onye nwere nwunye ọhu bu onye nālu nwunye ọhu: ma enyì nke onye nālu nwunye ọhu, onye nēguzo nānu kwa okwu-ya, ọ nāṅuri ọṅu nke-uku n'ihi olu onye ahu nālu nwunye ọhu: ya mere emezuwo ọṅùm a. 30 Ya onwe-ya aghaghi idi nāba uba, ma aghaghm idi nāla alà. 31 Onye si n'elu bia ka ihe nile elu: onye si n'ala puta nāputa n'ala, si kwa n'ala nēkwu okwu: Onye si n'elu-igwe bia ka ihe nile elu. 32 Ihe nke ọ huworo na nke Ọ nuru, nka ka Ọ nāb͕a àmà; ma ọ dighi onye ọ bula nānara àmà-Ya. 33 Onye nara àmà-Ya kara akàrà-ya na nka, na Chineke bu Onye ezi-okwu. 34 N'ihi na Onye ahu Chineke zitere nēkwu okwu Chineke: n'ihi na O siteghi n'ọtùtù enye Mọ Nsọ. 35 Nna nāhu Ọkpara-Ya n'anya, O nyewo kwa Ya ihe nile n'aka. 36 Onye kwere n'Ọkpara ahu nwere ndu ebighi-ebi; ma onye nēkweyeghi Ọkpara ahu agaghi-ahu ndu, kama iwe Chineke nānọgide n'aru-ya.

Jọn 4

1 Ya mere mb͕e Onye-nwe-ayi mara na ndi-Farisi nururi na Jisus nēme madu ka ha buru ndi nēso uzọ-Ya, na Ọ nēme kwa ha baptism, kari Jọn, 2 (ọ bu ezie na Jisus onwe-ya emeghi baptism, kama ọ bu ndi nēso uzọ-Ya), 3 Ọ rapuru Judia, we je Galili ọzọ. 4 Ma Ọ ghaghi igabiga n'etiti Sameria. 5 Ya mere Ọ bia rue otù obodo nke Sameria, anākpọ Saika, na nso iberibe ala ahu nke Jekob nyere nwa-ya Josef: 6 ma isi-iyi Jekob di n'ebe ahu. Ya mere Jisus, ebe ike gwuru Ya n'ije-Ya, Ọ nọduru ala otú a n'usọ isi-iyi ahu. Ọ ra ka oge hour nke-isi. 7 Otù nwanyi, bú onye Sameria, bia isere miri: Jisus si ya, Nyem miri ka M'ṅua. 8 N'ihi na ndi nēso uzọ-Ya jeriri n'obodo izu nri. 9 Ya mere nwanyi Sameria ahu si Ya, Gì onwe-gi si aṅa ariọ miri n'akam ka I ṅua, ebe I bu Onye-Ju, ma mu bu nwanyi Sameria? (N'ihi na ndi-Ju na ndi Sameria adighi-emekọ ihe. ) 10 Jisus zara, si ya, Ọ buru na i matara onyinye Chineke, na Onye Ọ bu Nke nāsi gi, Nyem miri ka M'ṅua; gi onwe-gi gāriọ Ya-ri, Ọ gēnye kwa gi miri di ndu. 11 Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, I nweghi ihe isere miri, ma olùlù-miri a di omimi: òle ebe kwa ka I nwere miri ahu di ndu? 12 Ọ̀ gābu na Gi onwe-gi ka nna-ayi Jekob uku, onye nyere ayi olùlù-miri a; ya onwe-ya, na umu-ya, na anu-ulo-ya, ṅu-kwa-ra nime ya? 13 Jisus zara, si ya, Onye ọ bula nke nāṅu miri a, akpiri gākpọ ya nku ọzọ: 14 ma onye ọ bula nke gāṅu miri ahu nke Mu onwem gēnye ya, akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi; kama miri ahu nke Mu onwem gēnye ya gāghọ nime ya isi-iyi miri nāsuputa ri nne rue ndu ebighi-ebi. 15 Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, nyem miri a, ka akpiri we ghara ikpọm nku, ka m'ghara kwa isi n'ogologo uzọ a nile bia ebe a isere miri. 16 Jisus si ya, Laba, kpọ di-gi, bia kwa n'ebe a. 17 Nwanyi ahu zara, si Ya, Enweghm di. Jisus si ya, I kwuru nke-ọma, si, Enweghi m di: 18 n'ihi na i nwewo di ise; ma onye i nwere ub͕u a abughi di-gi: nka ka i kwuworo n'ezie. 19 Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, ahurum na Gi onwe-gi bu onye-amuma. 20 Nna-ayi-hà nile kpọrọ isi ala nye Chineke n'ugwu a; ma unu onwe-unu si, na ebe madu aghaghi ikpọ isi ala nye Chineke di nime Jerusalem. 21 Jisus si ya, Nwanyi, kwerem, oge hour nābia, mb͕e unu nāgaghi-akpọ isi ala nye Nnam, ma ọ bu n'ugwu a, ma-ọbu na Jerusalem. 22 Unu onwe-unu nākpọ isi ala nye ihe unu nāmatagh: ayi onwe-ayi nākpọ isi ala nye ihe ayi matara: n'ihi na nzọputa si n'etiti ndi-Ju puta. 23 Ma oge hour nābia, ub͕u a ka ọ di kwa, mb͕e ndi nākpọ isi ala n'ezie gākpọ isi ala nye Nnam nime mọ na ezi-okwu: n'ihi na ndi di otú ahu ka Nnam nāchọ kwa ka ha buru ndi nākpọ isi ala nye Ya. 24 Chineke bu Mọ: ndi nākpọ kwa isi ala nye Ya aghaghi ikpọ isi ala nime mọ na ezi-okwu. 25 Nwanyi ahu si Ya, Amataram na Mesaia nābia (Onye anākpọ Kraist): mb͕e ọ bula Onye ahu gābia, Ọ gākọrọ ayi ihe nile. 26 Jisus si ya, Mu onwem Nke nāgwa gi okwu bu Ya. 27 Mb͕e Ọ nēkwu nka ndi nēso uzọ-Ya biara; o we ju ha anya na Ya na nwanyi nēkwurita okwu: otú ọ di, o nweghi onye ọ bula siri, Gini ka I nāchọ? ma-ọbu, Gini mere Gi na ya nēkwurita okwu? 28 Ya mere nwanyi ahu rapuru ite-miri-ya, we je ba nime obodo, si ndi ahu, 29 Bianu, le otù Nwoke, Onye gwaram ihe nile m'mere: Ònye a gābu Kraist ahu? 30 Ha siri n'obodo-ha puta, nābiakute kwa Ya. 31 Mb͕e ihe ndia nēme ndi nēso uzọ-Ya nāriọ Ya, si, Rabai, rie ihe. 32 Ma Ọ siri ha, Mu onwem nwere ihe-oriri iri nke unu onwe-unu nāmataghi. 33 Ya mere ndi nēso uzọ-Ya sirita onwe-ha, Ọ̀ di onye wetara Ya ihe Ọ gēri? 34 Jisus si ha, Ihe-oririm bu ka M'nēme ihe Onye ziterem nāchọ, ka M'luzu kwa ọlu-Ya. 35 Ùnu onwe-unu asighi, Ọnwa anọ fọduru, owuwe-ihe-ubi ewe bia? le, asim unu, Welienu anya-unu elu, kiri ubi, na ha chara acha ub͕u a ka ewere ihe di nime ha. 36 Onye nēwere ihe ubi nānara ugwọ-ọlu-ya, nāchikọta kwa nkpuru nye na ndu ebighi-ebi; ka onye nāgha nkpuru na onye nēwere ihe ubi we ṅuria ọṅu n'otù. 37 N'ihi na nime nka ka okwu a bu ezie, Otù onye nāgha nkpuru, ma onye ọzọ nēwere ihe ubi. 38 Mu onwem zigara unu iwere ihe ubi nke ọ dighi mb͕e unu onwe-unu dọb͕uworo onwe-unu n'ilu ya: ndi ọzọ adọb͕uwo onwe-ha n'ọlu, unu onwe-unu abàwo kwa na ndọb͕u-ha. 39 Ma ọtutu ndi Sameria si n'obodo ahu kwere na Ya n'ihi okwu nwanyi ahu, onye b͕ara àmà, si, Ọ gwaram ihe nile m'mere. 40 Ya mere mb͕e ndi Sameria biakutere Ya, ha riọ Ya ka Ọ nọyere ha: O we nọgide n'ebe ahu ubọchi abua. 41 Ma ndi kwere n'ihi okwu-Ya kariri ri nne; 42 ha we si nwanyi ahu, Ọ bughi n'ihi ihe i kwuru ka ayi nēkwe ub͕u a: n'ihi na ayi onwe-ayi anuwo, mata kwa na Onye a bu Onye-nzọputa nke uwa n'ezie. 43 Ma mb͕e ubọchi abua ahu gasiri, O si n'ebe ahu pua ba na Galili. 44 N'ihi na Jisus onwe-ya b͕ara àmà, na adighi-asọpuru onye-amuma n'ala nke aka ya. 45 Ya mere mb͕e Ọ biara na Galili, ndi Galili nara Ya nke-ọma, ebe ha hururi ka ihe O mere na Jerusalem ra n'ememe: n'ihi na ha onwe-ha je-kwa-ra ememe ahu. 46 Ya mere Ọ biaruru Kena nke Galili ozọ, ebe O mere miri ka ọ ghọ manya-vine, Ma otù nwoke nke nējere eze ozi di, nke aru nādighi nwa-ya nwoke ike na Kapanaum. 47 Mb͕e onye ahu nuru na Jisus esiwo na Judia puta ba na Galili, o jekuru Ya, riọ Ya ka Ọ ridata, me ka aru di nwa-ya ike; n'ihi na ọ nọ n'ọnu ọnwu. 48 Ya mere Jisus siri ya, Ọ buru na unu ahughi ihe-iriba-ama na ọlu-ebube, unu agaghi-ekwe ma-ọli. 49 Nwoke ahu nke nējere eze ozi si Ya, Onye-nwe-ayi, ridata mb͕e nwatakirim akānwughi. 50 Jisus si ya, Ga nke gi; nwa-gi nwoke di ndu. Nwoke ahu kwere okwu Jisus gwara ya, o we ga nke ya. 51 Ma mb͕e ọ nọ nārida ub͕u a, ndi-orù-ya zutere ya, si, na nwa-ya di ndu. 52 Ya mere ọ juru ha oge hour nke aru-ya malitere idi ya nma. Ya mere ha siri ya, Nnyahuru n'oge hour nke-asa ka aru-ọku rapuru ya. 53 Ya mere nna-ya mara na ọ bu n'oge hour ahu mb͕e Jisus siri ya, Nwa-gi nwoke di ndu: ya onwe-ya we kwere na èzí-na-ulo-ya dum. 54 Nka bu ihe-iriba-ama ọzọ nke mere ha abua nke Jisus mere, mb͕e O siri na Judia puta ba na Galili.

Jọn 5

1 Mb͕e ihe ndia gasiri otù ememe nke ndi-Ju di; Jisus we rigoro Jerusalem. 2 Ma ọdọ-miri ntà di na Jerusalem n'akuku ọnu-uzọ-ama nke aturu, nke anākpọ n'asusu Hibru Betesda, nke nwere ulo-ìbà ise. 3 Nime ndia ka ìgwè madu ndi aru-ha nādighi ike nēdina, ndi-ìsì, ndi-ngwurọ ndi akuku-aru-ha kpọnwuru akpọnwu, [nēche uṅarà nke miri ahu. 4 N'ihi na mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi nāridata n'ọdọ-miri ntà ahu n'oge ufọdu, we kpasue miri ahu: ya mere onye buru uzọ ba nime ya mb͕e akpasusiri miri ahu, eme ka aru di ya nma, n'ọria ọ bula jidere ya. ] 5 Ma otù nwoke nọ n'ebe ahu, onye nọri orú arọ na iri na asatọ na nriaria-ya. 6 Mb͕e Jisus huru onye a ka o nēdina, ebe Ọ ma-kwa-ra na ọ nọri ogologo oge n'ọnọdu ahu, Ọ si ya, Ì nāchọ ka eme ka aru di gi nma? 7 Onye ahu aru nādighi ike zara Ya, si, Onye-nwe-ayi, enweghm madu, ka ọ tubàm n'ọdọ-miri ntà nka, mb͕e ọ bula akpasuru miri: ma mb͕e mu onwem nọ nābia, onye ọzọ eburum uzọ rida. 8 Jisus si ya, Bilie, chiri ute-gi, nējeghari. 9 Ngwa ngwa ewe me ka aru di nwoke ahu nma, o we chiri ute-ya, we nējeghari. Ma ọ bu ubọchi-izu-ike n'ubọchi ahu. 10 Ya mere ndi-Ju nāsi onye ahu emere ka aru-ya di ike, Ọ bu ubọchi-izu-ike, o zighi kwa ezi n'iwu ka i chiri ute-gi. 11 Ma ọ zara ha, si, Onye mere ka aru dim nma, onye ahu sirim, Chiri ute-gi, nējeghari. 12 Ha juru ya, si, Ònye bu Madu ahu Nke siri gi, Chiri ute-gi nējeghari? 13 Ma onye ahu emere ka aru di ya ike amataghi Onye ọ bu: n'ihi na Jisus wezugarari Onwe-ya, n'ihi na ìgwè madu di n'ebe ahu. 14 Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus chọputara ya n'ulo uku Chineke, si ya, Le, emewo ka aru di gi nma: emehiela ọzọ, ka ihe jọkariri njọ ghara ime gi. 15 Nwoke ahu jere, gwa ndi-Ju na ọ bu Jisus mereri ka aru di ya nma. 16 N'ihi nka ka ndi-Ju nēsob͕u kwa Jisus, n'ihi na Ọ nēme ihe ndia n'ubọchi-izu-ike. 17 Ma Jisus zara ha, si, Nnam nālu ọlu rue ub͕u a, Mu onwem nālu kwa ọlu. 18 Ya mere n'ihi nka ka ndi-Ju nāchọ kari uzọ ib͕u Ya, n'ihi na ọ bughi nání na Ọ nēmebi ubọchi-izu-ike, kama Ọ nākpọ kwa Chineke Nna nke aka Ya, nēme ka Ya onwe-ya na Chineke ra. 19 Ya mere Jisus zara, si ha, N'ezie, n'ezie asim unu, Ọkpara apughi ime ihe ọ bula n'Onwe-ya, ma-ọbughi ihe Ọ huru na Nna-Ya nēme: n'ihi na ihe ọ bula Ya onwe-ya nēme, ndia ka Ọkpara-Ya nēme kwa otú ahu. 20 N'ihi na Nnam nāhu Ọkpara-Ya n'anya, nēgosi kwa Ya ihe nile Ya onwe-ya nēme: oké ọlu kari ndia ka Ọ gēgosi kwa Ya, ka o we ju unu onwe-unu anya. 21 N'ihi na dika Nnam nēme ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, dika Ọ nēme kwa ka ha di ndu, otú a ka Ọkpara-Ya nēme kwa ka ndi Ọ nāchọ di ndu. 22 N'ihi na Nnam adighi-ekpe kwa madu ọ bula ikpé, kama O werewo ikpé nile nye Ọkpara-Ya; 23 ka madu nile we sopuru Ọkpara ahu, dika ha nāsọpuru Nna-Ya. Onye nādighi-asọpuru Ọkpara adighi-asọpuru Nna Nke zitere Ya. 24 N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nānu okwum, nke nēkwere kwa Onye ziterem, o nwere ndu ebighi-ebi, ọ biaghi kwa n'ikpé, kama o sitewo n'ọnwu ba na ndu. 25 N'ezie, n'ezie, asim unu, Oge hour nābia, ub͕u a ka ọ di kwa, mb͕e ndi nwuru anwu gānu olu Ọkpara Chineke; ndi nuru gādi kwa ndu. 26 N'ihi na dika Nnam nwere ndu nime Onwe-ya, otú a ka O nye-kwa-ra Ọkpara-Ya inwe ndu nime Onwe-ya: 27 O nye-kwa-ra Ya ike ilu ọlu ikpé, n'ihi na Ọ bu Nwa nke madu. 28 Ka ihe a ghara iju unu anya: n'ihi na oge hour nābia mb͕e ndi nile di n'ílì gānu olu-Ya, 29 ha gāputa kwa; ndi mere ezi ihe gābà na nbilite-n'ọnwu nke ndu; ma ndi mere ihe nādighi nma gābà na nbilite-n'ọnwu nke ikpé. 30 Mu onwem apughi ime ihe ọ bula n'Onwem: dika M'nānu M'nēkpe: ikpem zi-kwa-ra ezi; n'ihi na etughi m ihe Mu onwem nāchọ, kama ihe Onye ziterem nāchọ. 31 Ọ buru na Mu onwem ab͕ara Onwem àmà, àmàm abughi ezie. 32 Ọ bu onye ọzọ nab͕aram àmà; amata-kwa-ram na àmà nke Ọ nāb͕aram bu ezie. 33 Unu onwe-unu ezigaworo Jọn, ọ b͕awo-kwa-ra ezi-okwu ahu àmà. 34 Ma àmà nke Mu onwem nānara esighi n'ọnu madu puta: otú ọ di, ihe ndia ka M'nēkwu, ka ewe zọputa unu. 35 Onye ahu bu oriọna ahu nke nēre ere nenwu kwa: unu onwe-unu chọ-kwa-ra ka obi tọ unu ụtọ nke-uku n'ìhè-ya nwa oge. 36 Ma àmà nke Mu onwem ji ka nke Jọn uku: n'ihi na ọlu nke Nnam nyeworom ka M'luzue ha, ọlu ahu onwe-ha nke M'nālu, nāb͕aram àmà, na Nnam ziteworom. 37 Nna nke ziterem, Ya onwe-ya ab͕awo-kwa-ram àmà. Ọ dighi mb͕e ọ bula unu nuworo olu-Ya, ọ dighi kwa mb͕e ọ bula unu huworo oyiyi-Ya. 38 Unu enweghi kwa okwu-Ya ka ọ nọgide nime unu: n'ihi na Onye Ya onwe-ya zitere, Onye ahu ka unu onwe-unu nēkweghi 39 Unu nēnyocha ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, n'ihi na unu onwe-unu nēchè na unu nēnwe ndu ebighi-ebi nime ha; ha onwe-ha bu kwa ihe nāb͕aram àmà; 40 unu achọghi kwa ibiakutem, ka unu we nwe ndu. 41 Anaraghi m otuto n'aka madu. 42 Ma amaram unu, na unu enweghi ihu-n'anya Chineke nime onwe-unu. 43 Mu onwem abiawo n'aha Nnam, ma unu anaraghm: ọ buru na onye ọzọ gābia n'aha nke aka ya, onye ahu ka unu gānara. 44 Ùnu onwe-unu si aṅa pu ikwe, ebe unu nānara otuto n'aka ibe-unu, ma otuto nke si n'aka Onye ahu Nke nání Ya bu Chineke bia unu achọghi? 45 Unu echèla na Mu onwem gēbo unu ebubo n'iru Nnam: otù onye di nēbo unu ebubo, bú Moses, onye unu onwe-unu tukwasiworo obi-unu na ya. 46 N'ihi na ọ buru na unu kwere Moses, unu gēkwem; n'ihi na ya onwe-ya dere ihe bayerem n'akwukwọ. 47 Ma ọ buru na unu ekweghi ihe onye ahu dere n'akwukwọ, ùnu gēsi aṅa kwere okwu nkem?

Jọn 6

1 Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus jere n'ofè ọzọ nke oké osimiri Galili, nke bu osimiri Taibirias. 2 Oké ìgwè madu we so Ya, n'ihi na ha huru ihe-iriba-ama di iche iche nke Ọ nēme n'aru ndi aru-ha nādighi ike. 3 Jisus we rigo n'ugwu ahu, n'ebe ahu ka Ya na ndi nēso uzọ-Ya nọdu-kwa-ra ala. 4 Ma ngabiga, bú ememe ndi-Ju, di nso. 5 Ya mere Jisus, mb͕e O weliri anya-Ya elu, hu na oké ìgwè madu nābiakute Ya, Ọ si Filip, Òle ebe ayi gāzuta ob͕e achicha, ka ndia we rie ihe? 6 Ma nka ka O kwuru inwa ya: n'ihi na Ya onwe-ya matara ihe Ọ gāje ime. 7 Filip zara Ya, Ob͕e achicha ọgu shilling iri agaghi-ezu ha, ka madu nile n'otù we were nke-ntà nke-ntà. 8 Otù nime ndi nēso uzọ-Ya, bú Andru nwa-nne Saimon Pita, si Ya, 9 Otù nwa-okoro ntà nọ n'ebe a, onye ji ob͕e achicha barley ise, na azù abua: ma ǹdia bu gini n'etiti ọtutu madu di otú a? 10 Jisus siri, Menu ka madu ndia nọdu ala. Ma ahihia riri nne n'ebe ahu. Ya mere ndikom ahu we nọdu ala, n'ọnu-ọgugu ra ka nnù iri na nnù abua na ọgu iri. 11 Ya mere Jisus nara ob͕e achicha ise ahu, we kele, we kèsa ha nye ndi nānọdu ala; otú ahu O were azù ahu kèsa nye ha ka azù ha chọrọ ra. 12 Ma mb͕e afọ juru ha, Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Chikọtanu iberibe fọduru, ka ihe ọ bula ghara ila n'iyì. 13 Ya mere ha chikọtara ha, we kpoju nkata iri na abua n'iberibe sitere n'ob͕e achicha barley ise ahu, nke fọduru ndi riworori. 14 Ya mere mb͕e ndi ahu huru ihe-iriba-ama O mere, ha siri, N'ezie Onye a bu onye-amuma ahu nke nābia n'uwa. 15 Ya mere mb͕e Jisus huru na ha gaje ibia idọkpuru Ya n'ike, ka ha we me Ya eze, O wezugara Onwe-ya ọzọ n'ugwu nání Ya onwe-ya. 16 Ma mb͕e o ruru anyasi, ndi nēso uzọ-Ya ridara n'oké osimiri; 17 ha we ba n'ub͕ọ, we nāgabiga ofè oké osimiri ọzọ iga ru Kapanaum. Ọchichiri ab͕awo-kwa-ri ub͕u a, Jisus akābiakuteghi kwa ha. 18 Oké osimiri nēbili kwa, n'ihi na oké ifufe nēfe. 19 Ya mere mb͕e ha nyasiri ihe dika orú furlong na ise ma-ọbu orú na iri, ha hu Jisus ka Ọ nēje ije n'elu oké osimiri, nābiaru kwa ub͕ọ-ha nso: ha we tua egwu. 20 Ma Ọ siri ha, Ọ bu Mu onwem; unu atula egwu. 21 Ya mere ha chọrọ iwebata Ya nime ub͕ọ-ha: ngwa ngwa ub͕ọ-ha we rue ala ebe ha nāga. 22 N'echi-ya, ìgwè madu ndi guzoro n'ofè ọzọ nke oké osimiri ahu huru na ub͕ọ ntà ọzọ adighi n'ebe ahu, ma-ọbughi otù, hu kwa na Jisus esoghi ndi nēso uzọ-Ya ba n'ub͕ọ-ha, kama na nání ndi nēso uzọ-Ya jere; 23 (otú ọ di, ub͕ọ ntà di iche iche sitere na Taibirias bia rue ebe ahu nso ebe ha riri achicha ahu mb͕e Onye-nwe-ayi kelesiri ekele): 24 ya mere mb͕e ìgwè madu ahu huru na Jisus anọghi n'ebe ahu, na ndi nēso uzọ-Ya anọghi kwa, ha onwe-ha bàra n'ub͕ọ ntà, we bia Kapanaum, nāchọ Jisus. 25 Mb͕e ha chọputara Ya n'ofè oké osimiri ọzọ, ha si Ya, Rabai, òle mb͕e I biara n'ebe a? 26 Jisus zara ha, si, N'ezie, n'ezie, asi m unu, Unu nāchọm, ọ bughi n'ihi na unu huru ihe-iriba-ama kama ọ bu n'ihi na unu riri ufọdu nime ob͕e achicha ahu, afọ ju kwa unu. 27 Unu alula ọlu inata ihe-oriri nke nāla n'iyì, kama inata ihe-oriri nke nānọgide rue ndu ebighi-ebi, nke Nwa nke madu gēnye unu: n'ihi na Onye ahu ka Nna, bú Chineke, kara akàrà. 28 Ya mere ha siri Ya, Gini kwesiri ka ayi me, ka ayi we lua ọlu Chineke nile? 29 Jisus zara, si ha, Nka bu ọlu Chineke, ka unu kwere n'Onye ahu Ya onwe-ya zitere. 30 Ya mere ha siri Ya, Gini kwa ka Gi onwe-gi nēme ka ọ buru ihe-iriba-ama, ka ayi we hu, kwere kwa Gi? gini ka I nālu? 31 Nna-ayi-hà riri manna n'ọhia; dika edeworo n'akwukwọ nsọ, si, Nri nke sitere n'elu-igwe ka O nyere ha ka ha rie. 32 Ya mere Jisus siri ha, N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ bughi Moses nyere unu nri ahu nke sitere n'elu-igwe; kama ọ bu Nnam nēnye unu ezi nri ahu nke sitere n'elu-igwe. 33 N'ihi na nri nke Chineke bu nke ahu nke nēsi n'elu-igwe aridata, nke nēnye kwa uwa ndu. 34 Ya mere ha siri Ya, Onye-nwe-ayi, nye ayi nri a mb͕e nile. 35 Jisus siri ha, Mu onwem bu nri nēnye ndu: onye nābiakutem, agu agaghi-agu ya ma-ọli, onye nēkwere kwa na Mu akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli mb͕e ọ bula. 36 Ma asirim unu, na unu ahuwom, ma unu ekweghi. 37 Ihe nile nke Nnam nēnyem gābiakutem; onye nābiakutekwam M'gaghi-achupu ya ma-ọli. 38 N'ihi na esiwom n'elu-igwe ridata, ọ bughi ka M'nēme ihe Mu onwem nāchọ, kama ka M'nēme ihe Onye ziterem nāchọ. 39 Ma nka bu ihe Onye ziterem nāchọ, ka M'ghara itufu ihe ọ bula nime ihe nile O nyeworo m, kama ka M'me ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu. 40 N'ihi na nka bu ihe Nnam nāchọ, ka onye ọ bula nke nēle Ọkpara-Ya anya, nke nēkwere kwa na Ya, we nwe ndu ebighi-ebi; Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu. 41 Ya mere ndi-Ju nātamu ntamu megide Ya, n'ihi na Ọ siri, Mu onwem bu nri nke siri n'elu-igwe ridata. 42 Ha we si, Onye a, Ọ̀ bughi Jisus, Nwa Josef, Onye ayi onwe-ayi mara nna-Ya na nne-Ya? Ò si aṅa kwue ub͕u a, Esiwom n'elu-igwe ridata? 43 Jisus zara, si ha, Unu atamula n'etiti onwe-unu. 44 Ọ dighi onye ọ bula puru ibiakutem, ọ buru na Nna Nke ziterem adọghi ya: Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu. 45 Edewo ya n'akwukwọ ndi-amuma, si, Ha nile gābu kwa ndi Chineke zíworo ihe. Onye ọ bula nke nuworo site n'ọnu Nnam, nke mutawo-kwa-ra ihe, ọ nābiakutem. 46 Ọ bughi na madu ọ bula ahuwo Nnam, ma-ọbughi Onye ahu Nke si n'ebe Chineke nọ puta, Onye ahu ahuwo Nnam. 47 N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nēkwere nēnwe ndu ebighi-ebi. 48 Mu onwem bu nri nke nēnye ndu. 49 Nna-unu-hà riri manna ahu n'ọhia, ha we nwua. 50 Nka bu nri nke si n'elu-igwe ridata, ka madu we rie ufọdu nime ya, ghara kwa inwu anwu. 51 Mu onwem bu nri di ndu nke siri n'elu-igwe ridata: ọ buru na madu erie ufọdu nime nri a, ọ gādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi: ma nri nke Mu onwem gēnye kwa bu anu-arum, n'ihi ndu nke uwa. 52 Ya mere ndi-Ju nālurita uka n'etiti onwe-ha, si, Onye a, Ò si aṅa pu inye ayi anu-aru-Ya ka ayi rie? 53 Ya mere Jisus siri ha, N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na unu erighi anu-aru nke Nwa nke madu, ọ buru kwa na unu aṅughi ọbara-Ya, unu enweghi ndu nime onwe-unu. 54 Onye nēri anu-arum, nke nāṅu kwa ọbaram, o nwere ndu ebighi-ebi; Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu. 55 N'ihi na anu-arum bu ihe-oriri n'ezie, ọbaram bu kwa ihe-ọṅuṅu n'ezie. 56 Onye nēri anu-arum, nke nāṅu kwa ọbaram, ọ nānọgide nimem, Mu onwem kwa nime ya. 57 Dika Nna Nke di ndu ziterem, dika Mu onwem di kwa ndu n'ihi Nnam; otú a onye nērim, onye ahu gādi kwa ndu n'ihim. 58 Nka bu nri ahu nke siri n'elu-igwe ridata: ọ bughi dika nna-unu-hà riri, we nwua: onye nēri nri a gādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi. 59 Ihe ndia ka O kwuru n'ulo-nzukọ, mb͕e O nēzí ihe na Kapanaum. 60 Ya mere ọtutu nime ndi nēso uzọ-Ya, mb͕e ha nuru okwu ahu, ha siri, Okwu a di ike; ònye puru inu ya? 61 Ma ebe Jisus mara n'Onwe-ya na ndi nēso uzọ-Ya nātamu ntamu n'ihi nka, Ọ siri ha, Ọ̀ bu nka nēme ka unu ma n'ọnyà? 62 Ùnu agaghi-amakari kwa n'ọnyà ma ọ buru na unu ahu Nwa nke madu ka Ọ nārigo n'ebe Ọ nọri na mbu? 63 Ọ bu Mọ nēme ka madu di ndu; anu-aru abaghi urù ọ bula: okwu nke Mu onwem gwaworo unu, ha bu mọ, buru kwa ndu. 64 Ma ufọdu ndi nēkweghi di n'etiti unu. N'ihi na Jisus mara site na mbu ndi ha bu ndi nēkweghi, na onye ọ bu nke gārara Ya nye. 65 O we si, Ọ bu n'ihi nka ka M'siworo unu, na ọ dighi onye ọ bula puru ibiakutem, ọ buru na enyeghi ya site n'aka Nnam. 66 Site na nka ọtutu nime ndi nēso uzọ-Ya we laghachi azu, ha esoghi kwa Ya ejeghari ọzọ. 67 Ya mere Jisus siri ndi-ozi iri na abua ahu, Ùnu onwe-unu nāchọ kwa ila? 68 Saimon Pita zara Ya, si, Onye-nwe-ayi, Ònye ka ayi gējekuru? I nwere okwu nke ndu ebighi-ebi. 69 Ọzọ, ayi onwe-ayi ekwerewo mara kwa na Gi onwe-gi bu Onye Nsọ ahu nke Chineke. 70 Jisus zara ha, si, Ọ̀ bughi Mu onwem rọputara unu, bú ndi-ozi iri na abua, ma otù onye nime unu bu nwa ekwensu? 71 Ma Ọ nēkwu ihe bayere Judas nwa Saimon Iskariot, n'ihi na onye ahu gaje irara Ya nye, buri otù onye nime ndi-ozi iri na abua ahu.

Jọn 7

1 Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus we nējeghari na Galili: n'ihi na Ọ chọghi ijeghari na Judia, n'ihi na ndi-Ju nāchọ uzọ ib͕u Ya. 2 Ma ememe ahu nke ndi-Ju, bú ememe ulo-ikwū, di nso. 3 Ya mere umu-nne-Ya siri Ya, Si n'ebe a pua, je na Judia, ka ndi nēso uzọ-Gi we hu kwa ọlu-Gi nile nke I nālu. 4 N'ihi na ọ dighi onye ọ bula nēme ihe ọ bula na nzuzo, ma asi na ya onwe-ya nāchọ ka ọra madu mara ya. Ọ buru na I nēme ihe ndia, me Onwe-gi ka I puta ìhè nye uwa. 5 N'ihi na ọbuná umu-nne-Ya ekweghi na Ya. 6 Ya mere Jisus si ha, oge nkem akērughi; ma oge nke unu bu ihe edoziworo mb͕e nile. 7 Uwa apughi ikpọ unu asì; ma ọ nākpọ Mu onwem asì, n'ihi na Mu onwem nāb͕ara ya àmà, na ọlu-ya nile jọrọ njọ. 8 Rigonu onwe-unu n'ememe a: Mu onwem agaghi-arigoro ememe a ub͕u a; n'ihi na oge nkem akēzughi. 9 Ma mb͕e Ọ gwasiri ha okwu ndia, Ọ nānọgide na Galili. 10 Ma mb͕e umu-nne-Ya rigosiri ememe ahu, mb͕e ahu Ya onwe-ya rigo-kwa-ra, ọ bughi n'iru ọra madu, kama dika ọ bu na nzuzo. 11 Ya mere ndi-Ju nāchọ Ya n'ememe, nāsi, Òle ebe Onye ahu nọ? 12 Oké ntamu di kwa n'etiti ìgwè madu nile bayere Ya: ufọdu nāsi, Ọ bu ezi madu; ndi ọzọ nāsi, É-è, kama Ọ nēduhie ìgwè madu a. 13 Otú ọ di, ọ dighi onye ọ bula nēkwuwa okwu bayere Ya n'ihi egwu ndi-Ju. 14 Ma mb͕e o ruru n'etiti ememe ahu ub͕u a Jisus rigoro n'ulo uku Chineke, we nēzí ihe. 15 Ya mere o nēju ndi-Ju anya, ha si, Onye a, Ò si aṅa mata akwukwọ ri nne, n'ebe ọ dighi mb͕e Ọ muworo akwukwọ? 16 Ya mere Jisus zara ha, si, Ozizím abughi nkem, kama ọ bu nke Onye ziterem. 17 Ọ buru na onye ọ bula achọ ime ihe Ọ nāchọ, ọ gāmara ihe ozizí a bu, ma o sitere n'aka Chineke, ma-ọbu na Mu onwem nēkwu site n'Onwem. 18 Onye nēkwu site n'onwe-ya nāchọ otuto nke aka ya: ma onye nāchọ otuto nke onye zitere ya, onye ahu bu onye ezi-okwu, ajọ omume adighi kwa nime ya. 19 Ọ̀ bughi Moses nyere unu iwu-unu, ma ọ dighi onye ọ bula nime unu nēme iwu ahu? Gini mere unu nāchọ uzọ ib͕um? 20 Ìgwè madu ahu zara, si, I nwere mọ ọjọ: ònye nāchọ uzọ ib͕u Gi? 21 Jisus zara, si ha, Otù ọlu ka M'luru, o we nēju unu nile anya. 22 Ọ bu n'ihi nka ka Moses nyere unu ibì-úgwù (ọ bughi na o sitere n'aka Moses, kama o sitere n'aka nna-ayi-hà); n'ubọchi-izu-ike unu nēbì kwa madu úgwù. 23 Ọ buru na ebì madu úgwù n'ubọchi-izu-ike, ka ewe ghara imebi iwu Moses; ùnu nwere òlùlù ọjọ n'arum, n'ihi na emerem ka aru dichasia otù madu nma n'ubọchi-izu-ike? 24 Unu elela iru kpe ikpé, kama nēkpenu ikpé ziri ezi. 25 Ya mere ufọdu nime ndi Jerusalem siri, Onye a, Ọ̀ bughi Onye ha nāchọ uzọ ib͕u? 26 Ma le, Ọ nēkwuwa okwu, ma ha agwaghi Ya okwu ọ bula. Ọ̀ gābu na ndi-isi mara n'ezie na Onye a bu Kraist-ayi? 27 Otú ọ di ayi matara Onye a ebe O si puta: ma mb͕e ọ bula Kraist-ayi gābia, ọ dighi onye ọ bula mara ebe O si puta. 28 Ya mere Jisus tiri nkpu n'ulo uku Chineke, nēzí ihe, nāsi kwa, Unu mataram, mata kwa ebe M'si puta; ọ bughi kwa n'Onwem ka M'biaworo, kama Onye ziterem bu ezi Onye, Nke unu onwe-unu nāmataghi. 29 Mu onwem matara Ya; n'ihi na esim n'ebe Ọ nọ bia, Ya onwe-ya zite-kwa-ram. 30 Ya mere ha chọrọ uzọ ijide Ya: ọ dighi kwa onye ọ bula tukwasiri Ya aka, n'ihi na oge hour Ya akābiaghi. 31 Ma n'etiti ìgwè madu ahu ọtutu kwere na Ya; ha nāsi kwa, Mb͕e ọ bula Kraist-ayi gābia, Ọ̀ gēme ihe-iriba-ama kari nke Onye a mere? 32 Ndi-Farisi nuru ìgwè madu ahu ka ha nātamu ntamu ndia bayere Ya; ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi we ziga ndi nējere ha ozi ka ha jide Ya. 33 Ya mere Jisus siri, Ọ fọduru nwa oge Mu na unu gānọ, M'we lakuru Onye ziterem. 34 Unu gāchọm, ma unu agaghi-achọtam: ebe Mu onwem nọ kwa, unu onwe-unu apughi ibia. 35 Ya mere ndi-Ju siritara onwe-ha, Òle ebe Onye a gaje iga na ayi onwe-ayi agaghi-achọta Ya? Ọ̀ gaje igakuru ndi b͕asara n'etiti ndi-Grik na izí ndi-Grik ihe? 36 Gini bu okwu a nke O kwuru, si, Unu gāchọm, ma unu agaghi-achọtam: ebe Mu onwem nọ kwa, unu onwe-unu apughi ibia? 37 Ma n'ubọchi ikpe-azu, bú oké ubọchi nke ememe ahu, Jisus guzoro, we tie nkpu, si, Ọ buru na akpiri kpọrọ madu ọ bula nku, ya biakutem, ṅua miri. 38 Onye nēkwere na Mu, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ kwuru, n'afọ-ya ka osimiri nke miri di ndu gēsi nērùputa. 39 Ma nka ka O kwuru bayere Mọ Nsọ, Nke ndi kwere na Ya gaje inara: n'ihi na akēnyeghi Mọ Nsọ; n'ihi na akēnyeghi Jisus otuto. 40 Ya mere ufọdu nime ìgwè madu ahu, mb͕e ha nuru okwu ndia, ha si, N'ezie Onye a bu onye-amuma ahu. 41 Ndi ọzọ nāsi, Onye a bu Kraist-ayi. Ma ufọdu nāsi, Gini, ọ̀ gābu na Galili ka Kraist-ayi si bia? 42 Àkwukwọ nsọ ekwughi na Kraist-ayi nēsi na nkpuru Devid bia, site kwa na Betlehem, bú obodo ntá ebe Devid nọri? 43 Ya mere nkewa putara n'etiti ìgwè madu ahu n'ihi Ya. 44 Ma ufọdu nime ha chọrọ ijide Ya; ma ọ dighi onye ọ bula tukwasiri Ya aka. 45 Ya mere ndi ahu ndi nēje ozi biakutere ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi; ndi ahu we si ha, N'ìhi gini ka unu nēkutaghi Ya? 46 Ndi ahu ndi nēje ozi zara, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula madu kwuru okwu di otú a. 47 Ya mere ndi-Farisi zara ha, si, Èduhiewo kwa unu onwe-unu? 48 Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti ndi-isi, ma-ọbu n'etiti ndi-Farisi, kwere na Ya? 49 Ma ìgwè madu a nke nāmaghi iwu-ayi bu ndi anābu ọnu. 50 Nikọdimọs si ha (onye biakutere Ya na mbu, ebe ọ bu otù onye nime ha), 51 Ìwu-ayi nēkpe madu ikpé, ọ buru na o bughi uzọ nu n'ọnu-ya, we mara ihe ọ nēme? 52 Ha zara, si ya, Gì onwe-gi si kwa na Galili puta? Nyocha n'akwukwọ nsọ, le kwa na ọ dighi onye-amuma si na Galili bilie. 53 Ha nile we la, onye ọ bula n'ulo nke aka ya:

Jọn 8

1 ma Jisus gara ugwu Olive. 2 O we bia kwa ọzọ n'isi-ututu n'ulo uku Chineke, ndi-Ju nile we biakute Ya; O we nọdu ala, we nēzí ha ihe. 3 Ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi we kuta otù nwanyi nke ejidereri n'ikwa-iko; mb͕e ha guzosiri ya n'etiti, 4 ha we si Ya, Onye-ozizí, ejidewo nwanyi a n'ikwa-iko, mb͕e ọ nēme ihe ahu. 5 Ma n'iwu-ayi Moses nyere ayi iwu itu ndinyom di otú a nkume: gini kwa ka Gi onwe-gi nēkwu bayere ya? 6 Ma nka ka ha nēkwu inwa Ya, ka ha we nwe ihe ha gēji bo Ya ebubo. Ma Jisus ruru ala, were nkpisi-aka-Ya nēde ihe n'ala. 7 Ma mb͕e ha nọgidere nāju Ya, O welie Onwe-ya elu, si ha, Onye akēmehieghi n'etiti unu, ya buru uzọ tu ya nkume. 8 O we ruru kwa ala ọzọ, were nkpisi-aka-Ya nēde ihe n'ala. 9 Ma mb͕e ha nuru ya ha pua n'otù n'otù, malite na ndi bu okenye, rue ndi-ikpe-azu: ewe rapu nání Jisus, Ya na nwanyi ahu, ebe o guzoro, n'etiti. 10 Jisus we welie Onwe-ya elu, si ya, Nwanyi, òle ebe ha nọ? ọ̀ dighi onye ọ bula mara gi ikpé? 11 O we si, Ọ dighi onye ọ bula, Onye-nwe-ayi. Jisus we si, Mu onwem amaghi kwa gi ikpé: ga nke gi. site n'ub͕u a adila nēmehie ọzọ. 12 Ya mere Jisus gwara ha okwu ọzọ, si, Mu onwem bu Ìhè nke uwa: onye nēsom agaghi-ejeghari n'ọchichiri, kama ọ gēnwe Ìhè nke ndu. 13 Ya mere ndi-Farisi siri Ya, Gi onwe-gi nāb͕ara Onwe-gi àmà; àmà nke Gi abughi ezie. 14 Jisus zara, si ha, Asi kwa na Mu onwem b͕ara Onwem àmà, àmà nkem bu ezie; n'ihi na amataram ebe M'siri bia, na ebe M'nāla; ma unu onwe-unu amataghi ebe M'si bia, ma-ọbu ebe M'nāla. 15 Unu onwe-unu nēkpe dika anu-aru si di; Mu onwem ekpeghi onye ọ bula. 16 Ma ọ buru na mu onwem ekpe kwa ikpé, ikpém bu ezie; n'ihi na ọ bughi nání Mu nọ, kama ọ bu Mu onwem na Nna Nke ziterem. 17 Ma edewo kwa n'akwukwọ iwu-unu, na àmà nke madu abua bu ezie. 18 Mu onwem bu onye nāb͕ara Onwem àmà, Nna Nke ziterem nāb͕a-kwa-ram àmà. 19 Ya mere ha si Ya, Òle ebe Nna-Gi di? Jisus zara, si, Unu amataghi m, unu amataghi kwa Nnam: ọ buru na unu mataram, unu gāmata-kwa-ri Nnam. 20 Okwu ndia ka O kwuru n'ebe anēdebe ùtú anātu, mb͕e Ọ nēzí ihe n'ulo uku Chineke: ọ dighi kwa onye ọ bula jidere Ya; n'ihi na oge hour Ya akābiarughi. 21 Ya mere Ọ siri ha ọzọ, Mu onwem nāla, unu gāchọkwam, unu gānwu kwa na nmehie-unu: ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia. 22 Ya mere ndi-Ju nāsi, Ò gēb͕u Onwe-ya, na Ọ nāsi, Ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia? 23 O we si ha, Unu onwe-unu si n'ebe di ala puta; Mu onwem si n'ebe di elu puta: unu onwe-unu si n'uwa nka puta; Mu onwem esighi n'uwa nka puta. 24 Ya mere M'siri unu, na unu gānwu na nmehie nile unu: n'ihi na ọ buru na unu ekweghi na Mu onwem bu Ya, unu gānwu na nmehie nile unu. 25 Ya mere ha nāsi Ya, Gì onwe-gi bu onye? Jisus siri ha, Ọbuná ihe M'nāgwa kwa unu site na mbu. 26 Enwerem ọtutu ihe M'gēkwu nke M'gēkpe kwa bayere unu: ma Onye ziterem bu ezie; ihe Mu onwem nu-kwa-ra n'ọnu Ya, ihe ndia ka M'nāgwa uwa. 27 Ha amaghi na Ọ nāgwa ha okwu bayere Nna-Ya. 28 Ya mere Jisus siri, Mb͕e ọ bula unu gēweliwori Nwa nke madu elu, mb͕e ahu ka unu gāmara na Mu onwem bu Ya, na ọ dighi kwa ihe M'nēme n'Onwem, kama dika Nnam zírim, otú a ka m'nēkwu ihe ndia. 29 Mu na Onye ziterem nọ kwa; Ọ rapughi nání Mu; n'ihi na Mu onwem nēme ihe nātọ Ya utọ mb͕e nile. 30 Mb͕e Ọ nēkwu okwu ndia, ọtutu madu kwere na Ya. 31 Ya mere Jisus nāsi ndi-Ju ndi kwere-Ya-ri, Ọ buru na unu onwe-unu anọgide n'okwum, unu bu ndi nēso uzọm n'ezie; 32 unu gāmara kwa ezi-okwu, ezi-okwu ahu gēme kwa ka unu pua n'orù. 33 Ha zara Ya, si, Ayi bu nkpuru Abraham, ọ kādighi kwa mb͕e ọ bula ayi bu orù onye ọ bula: Gì onwe-gi si aṅa kwu, Agēme ka unu pua n'orù? 34 Jisus zara ha, si, N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye ọ bula nke nēmehie bu orù nmehie. 35 Ma orù adighi-anọgide n'ulo rue mb͕e ebighi-ebi: nwa nānọgide ebighi-ebi. 36 Ya mere ọ buru na Ọkpara gēme ka unu pua n'orù, unu gābu ndi puworo n'orù n'ezie. 37 Amataram na unu bu nkpuru Abraham; ma unu nāchọ uzọ ib͕um, n'ihi na okwum enweghi ọnọdu nime unu. 38 Anamekwu ihe Mu onwem huworo n'ebe Nnam nọ: ya mere unu onwe-unu nēme kwa ihe unu nuru n'ọnu nna-unu. 39 Ha zara, si Ya, Nna-ayi bu Abraham. Jisus si ha, Ọ buru na unu bu umu Abraham, unu gālu ọlu Abraham. 40 Ma ub͕u a unu nāchọ uzọ ib͕um, bú Madu Nke gwaworo unu ezi-okwu, nke M'nuru n'ọnu Chineke: nka ka Abraham nēmeghi. 41 Unu onwe-unu nālu ọlu nna-unu. Ha siri Ya, Amughi ayi onwe-ayi site n'ikwa-iko otù Nna ka ayi nwere, bú Chineke. 42 Jisus siri ha, Ọ buru na Chineke bu Nna-unu, unu gāhum n'anya: n'ihi na Mu onwem siri n'ebe Chineke nọ puta we bia; n'ihi na abiaghm n'Onwem, kama Ya onwe-ya ziterem. 43 N'ìhi gini ka unu nāmaghi ihe M'nēkwu? Ọ bu n'ihi na unu apughi inu okwum. 44 Unu onwe-unu sitere na nna-unu, bú ekwensu, ọ bu kwa ihe nāgu nna-unu ka unu nāchọ ime. Onye ahu bu ob͕u-madu site na mbu, o guzoghi kwa n'ezi-okwu, n'ihi na ezi-okwu adighi nime ya. Mb͕e ọ bula ọ nēkwu okwu-ugha, ọ nēkwu ihe si n'ihe nke aka ya puta: n'ihi na ọ bu onye-ugha, buru kwa nna-ya. 45 Ma n'ihi na Mu onwem nēkwu ezi-okwu, unu ekweghm. 46 Ònye nime unu turum nmehie n'anya? Ọ buru na M'nēkwu ezi-okwu, n'ìhi gini ka unu onwe-unu nēkweghm? 47 Onye sitere na Chineke nānu okwu Chineke: n'ihi nka ka unu onwe-unu nānughi ha, n'ihi na unu esiteghi na Chineke. 48 Ndi-Ju zara, si Ya, Àyi onwe-ayi ekwughi nke-ọma, si na Gi onwe-Gi bu Onye Sameria, I nwe-kwa-ra mọ ọjọ? 49 Jisus zara, si, Mu onwem enweghi mọ ọjọ; kama anamasọpuru Nnam, unu onwe-unu nēmekwam ihe-ihere. 50 Ma Mu onwem achọghi otuto nkem: otù Onye di Nke nāchọ nēkpe kwa ikpé. 51 N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na onye ọ bula edebe okwum, ọ gaghi-ahu ọnwu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi. 52 Ndi-Ju siri Ya, Ub͕u a ka ayi mara na I nwere mọ ọjọ. Abraham nwuru, na ndi-amuma; ma Gi onwe-gi nāsi, Ọ buru na onye ọ bula edebe okwum, ọ gaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi. 53 Ọ̀ gābu na Gi onwe-gi ka nna-ayi Abraham uku, onye nwuru anwu? ndi-amuma nwu-kwa-ra: ònye ka I nēme Onwe-gi? 54 Jisus zara, si, Ọ buru na Mu onwem enye Onwem otuto, otuto nkem bu ihe-efu: Nnam bu Onye nēnyem otuto; Onye unu onwe-unu nāsi, na Ọ bu Chineke-unu; 55 unu amaghi kwa Ya; ma Mu onwem matara Ya; ọ buru kwa na agamasi, Amataghm Ya, M'gēyi unu, buru onye-ugha: ma amataram Ya, nēdebe kwa okwu-Ya. 56 Obi tọrọ nna-unu Abraham utọ nke-uku ihu ub͕ọchim; o we hu ya, ṅuri kwa ọṅu. 57 Ya mere ndi-Ju siri Ya, I kāb͕aghi ọgu arọ abua na iri, Ì huwo kwa Abraham? 58 Jisus siri ha, N'ezie, n'ezie, asim unu, Mb͕e akāmughi Abraham Mu onwem di. 59 Ya mere ha tuturu nkume itu Ya: ma Jisus zobere Onwe-ya, we si n'ulo uku Chineke pua.

Jọn 9

1 Mb͕e Ọ nāgabiga, Ọ hu otù nwoke nke kpuru ìsì site n'ọmumu-ya. 2 Ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya, si, Rabai, ònye mehiere, onye a, ma-ọbu ndi muru ya, nke mere ka amua ya n'ìsì? 3 Jisus zara, si, Onye a emehieghi, ndi muru ya emehieghi kwa: kama ka ọlu Chineke we puta ìhè n'aru ya. 4 Ayi aghaghi ilu ọlu Onye ziterem, mb͕e ubọchi fọduru: abali nābia, mb͕e ọ dighi onye ọ bula puru ilu ọlu. 5 Mb͕e ọ bula M'nọ n'uwa, abum Ìhè nke uwa. 6 Mb͕e O kwusiri ihe ndia, Ọ bua ọnu-miri n'ala, were ọnu-miri ahu gwọ ájá, were ájá ahu te n'anya-ya abua, 7 si ya, Je sa miri n'ọdọ-miri ntà nke Sailoam (nke bu, ma asugharia ya, Onye eziteworo). Ya mere O jere, sa miri, bia kwa nāhu uzọ. 8 Ya mere ndi-ab͕ata-obi-ya, na ndi nāhu ya-ri n'oge gara aga, na ọ bu onye-aririọ, ha nāsi, Onye a, ọ̀ bughi onye nānọ ala nāriọ kwa aririọ? 9 Ndi ọzọ nāsi, Ọ bu ya; ndi ọzọ nāsi, É-è, kama o yiri ya. Ya onwe-ya siri, Mu onwem bu ya. 10 Ya mere ha nāsi ya, Èsi kwa aṅa meghe anya-gi? 11 Onye ahu zara, si, Nwoke ahu anākpọ Jisus gwọrọ ájá, te kwa ya n'anyam abua, sim, Je Sailoam, sa miri: ya mere ejerem, sa miri, ewe me ka M'hu uzọ. 12 Ha si ya, Òle ebe Onye ahu nọ? Ọ si, Amataghm. 13 Ha kutara ndi-Farisi onye ahu nke kpuru ìsì n'oge gara aga. 14 Ma ọ bu ubọchi-izu-ike n'ubọchi Jisus gwọrọ ájá, we meghe anya-ya. 15 Ya mere ndi-Farisi ju-kwa-ra ya ọzọ otú emere ọ hu uzọ. Ọ si ha, Ọ tukwasiri ájá n'anyam abua, m'we sa miri, nāhu kwa uzọ. 16 Ya mere ufọdu n'etiti ndi-Farisi nāsi, Nwoke a esiteghi n'ebe Chineke nọ, n'ihi na O dighi-edebe ubọchi-izu-ike. Ma ndi ọzọ nāsi, Nwòke bu onye-nmehie si aṅa pu ime ihe-iriba-ama di otú a? Nkewa we di n'etiti ha. 17 Ya mere ha si onye-ìsì ahu ọzọ, Gini ka gi onwe-gi nēkwu bayere Ya, n'ihi na O meghere anya-gi? Ọ si, Ọ bu onye-amuma. 18 Ya mere ndi-Ju ekweghi okwu bayere ya, na o kpururi ìsì, na eme-kwa-ra ya ka ọ hu uzọ, rue mb͕e ha kpọrọ ndi muru onye ahu emere ka ọ hu uzọ, 19 we jua ha, si, Onye a, ọ̀ bu nwa-unu, onye unu nāsi na amuru ya n'ìsì? ò si kwa aṅa hu uzọ ub͕u a? 20 Ndi muru ya zara, si, Ayi matara na onye a bu nwa-ayi, na amu-kwa-ra ya n'ìsì: 21 ma otú ọ nāhu uzọ ub͕u a, ayi amataghi; ma-ọbu onye meghere anya-ya, ayi onwe-ayi amatagh: juana ya; o ruwo dìnkpà; ya onwe-ya gēkwuru onwe-ya. 22 Ihe ndia ka ndi muru ya kwuru, n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju: n'ihi na ndi-Ju kwekọrọri n'etiti onwe-ha ub͕u a, ka esi n'ulo-nzukọ chupu onye ọ bula, ma ọ buru na ọ gēkwuputa na Ọ bu Kraist. 23 N'ihi nka ndi muru ya siri, O ruwo dìnkpà; juana ya. 24 Ya mere ha kpọrọ onye ahu nke ub͕ò abua, bú onye kpururi ìsì, we si ya, Nye Chineke otuto: ayi onwe-ayi matara na Nwoke a bu onye-nmhie. 25 Ya mere onye ahu zara, si, Ma Ọ bu onye-nmehie, amataghm: otù ihe ka m'matara, na, ebe m'kpururi ìsì, ub͕u a anamahu uzọ. 26 ya mere ha siri ya, Gini ka O mere gi? Ò si aṅa meghe anya-gi? 27 Ọ zara ha, si, Agwaram unu ọbuná ub͕u a, ma unu anugh: gini mere unu nāchọ inu ya ọzọ? ùnu onwe-unu nāchọ kwa ighọ ndi nēso uzọ-Ya? 28 Ha we kwutọ ya, si, Gi onwe-gi bu onye nēso uzọ Onye ahu; ma ayi onwe-ayi bu ndi nēso uzọ Moses. 29 Ayi onwe-ayi matara na Chineke agwawo Moses okwu: ma Onye a, ayi amataghi ebe O si puta. 30 Nwoke ahu zara, si ha, Ekwula, n'ihi na ihe-ebube di na nka, na unu onwe-unu amataghi ebe O si puta, ma Ọ meghere anyam. 31 Ayi matara na Chineke adighi-anu olu ndi-nmehie: kama ọ buru na onye ọ bula bu onye nēbi isi ala nye Chineke, nēme kwa ihe Ọ nāchọ, onye ahu ka Ọ nānu. 32 Site na nmalite oge a ọ dighi mb͕e anuru na onye ọ bula meghere anya onye amuru n'ìsì. 33 Ọ buru na Onye a esiteghi n'ebe Chineke nọ, Ọ pughi ime ihe ọ bula. 34 Ha zara, si ya, Amuru gi onwe-gi nime nmehie, ọ̀ bu gi onwe-gi nēzí kwa ayi ihe? Ha we chupu ya n'èzí. 35 Jisus nuru na ha chupuru ya-ri n'èzí; O we chọta ya, si, Gì onwe-gi kwere n'Ọkpara Chineke? 36 Onye ahu zara, si, Ọ̀ bu kwa onye, Onye-nwe-ayi, ka m'we kwere na Ya? 37 Jisus siri ya, I huwo Ya, Onye gi na Ya nēkwu okwu bu kwa Onye ahu. 38 O we si, Onye-nwe-ayi, ekwem. O we kpọ isi ala nye Ya. 39 Jisus we si, Ọ bu ikpé ka Mu onwem ji bia n'uwa nka, ka ndi nāhughi uzọ we hu; ka ndi huru uzọ we ghọ kwa ndi-ìsì. 40 Ndi di n'etiti ndi-Farisi ndi ha na Ya nọ nuru ihe ndia, ha we si Ya, Àyi onwe-ayi kpu-kwa-ra? 41 Jisus siri ha, Ọ buru na unu kpuru ìsì, unu agaghi-enwe nmehie: ma ub͕u a unu nāsi, Ayi nāhu uzọ: nmehie-unu nānọgide.

Jọn 10

1 N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nēsiteghi n'ọnu-uzọ ba n'ogige aturu, kama o si n'ebe ọzọ nārigo ibà, onye ahu bu onye-ori na onye nāpunara madu ihe. 2 Ma onye si n'ọnu-uzọ ba bu onye nāzù aturu. 3 Onye ahu ka onye-ọnu-uzọ nēmeghere uzọ; aturu nānu kwa olu-ya: ọ nākpọ kwa aturu nke aka ya n'aha, n'edupu kwa ha. 4 Mb͕e ọ bula ọ chupuru aturu nke aka ya nile, ọ nāga n'iru ha, aturu ahu nēso kwa ya: n'ihi na ha matara olu-ya. 5 Ma ha agaghi-eso ọbìa ma-ọli, kama ha gāb͕anari ya: n'ihi na ha amataghi olu ndi-ọbìa. 6 Ilu a ka Jisus turu ha: ma ha amaghi ihe ha bu, bú okwu Ọ nāgwa ha. 7 Ya mere Jisus siri ha ọzọ, N'ezie, n'ezie, asim unu, Mu onwem bu ọnu-uzọ nke aturu. 8 Ka ha ra, bú ndi nile burum uzọ bia, ha bu ndi-ori na ndi nāpunara madu ihe: ma aturu ahu anughi olu-ha. 9 Mu onwem bu ọnu-uzọ ahu: ọ buru na onye ọ bula esi na Mu ba, agāzọputa ya, ọ ganābata kwa nāpu kwa, nāhu kwa nri ọ gāta. 10 Onye-ori adighi-abia, ma-ọbughi ka o we zue ori, b͕u kwa, la kwa ihe n'iyì: Mu onwem biara ka ha we nwe ndu, ka ha nwebiga kwa ya ókè. 11 Mu onwem bu onye-ọzùzù-aturu ọma: onye-ọzùzù-aturu ọma nātọb͕ọ ndu-ya n'ihi aturu-ya. 12 Onye-ọlu egoro ego, nke nābughi kwa onye-ọzùzù-aturu, onye aturu nābughi nke aka ya, ọ nāhu agu ka ọ nābia, o we rapu aturu, b͕alaga, agu we nwude ha, chusa kwa ha: 13 n'ihi na ọ bu onye-ọlu egoro ego, ọ kpọghi kwa aturu ahu ihe. 14 Mu onwem bu onye-ọzùzù-aturu ọma; ama-kwa-ram aturu nkem, aturu nkem ma-kwa-ram, 15 dika Nnam maram, dika Mu onwem ma-kwa-ra Nnam; anamatọb͕ọ kwa ndum n'ihi aturum. 16 Aturu ọzọ ka M'nwe-kwa-ra, ndi nēsiteghi n'ogige-aturu nka: aghaghim iduta kwa ndi ahu, ha gānu kwa olum; otù ìgwè-aturu gādi kwa, otù Onye-ọzùzù-aturu. 17 N'ihi nka ka Nnam nāhum n'anya, n'ihi na Mu onwem nātọb͕ọ ndum, ka M'we nara ya ọzọ. 18 Ọ dighi onye ọ bula nānapum ya, kama Mu onwem nātọb͕ọ ya n'Onwem. Enwerem ike itọb͕ọ ya, enwe-kwa-ram ike inara ya ọzọ. Ihe a enyere n'iwu ka M'natara n'aka Nnam. 19 Nkewa putara ọzọ n'etiti ndi-Ju n'ihi okwu ndia. 20 Ọtutu nime ha we si, O nwere mọ ọjọ, anya adighi kwa Ya nma; gini mere unu nānu olu-Ya? 21 Ndi ọzọ nāsi, Ndia abughi okwu onye mọ ọjọ ji. Mọ̀ ọjọ puru imeghe anya ndi kpuru ìsì? 22 Ma ememe icheta owuwu ulo uku Chineke ọhu ruru na Jerusalem: ọ bu mb͕e oyi; 23 Jisus we nējeghari n'ulo uku Chineke n'ìbà Solomon. 24 Ya mere ndi-Ju nọgidere Ya buruburu, we si Ya, Ì nākwuba nkpuru-obi-ayi n'elu rue ole mb͕e? Ọ buru na Gi onwe-gi bu Kraist-ayi, gwawa ayi. 25 Jisus zara ha, si, Agwaram unu, ma unu adighi-ekwe: ọlu nke Mu onwem nālu n'aha Nnam, ndia nāb͕aram àmà. 26 Ma unu onwe-unu adighi-ekwe, n'ihi na unu adighi nime aturu nkem. 27 Aturu nkem nānu olum, Mu onwem ma-kwa-ra ha, ha nēsokwam: 28 Mu onwem nēnye kwa ha ndu ebighi-ebi; ha agaghi-ala kwa n'iyì ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ọ dighi kwa onye ọ bula gānapu ha n'akam. 29 Nnam, Nke nyeworom ha, bu Onye uku kachasi ihe nile; ọ dighi kwa onye ọ bula puru inapu ihe n'aka Nnam. 30 Mu onwem na Nnam bu otù. 31 Ndi-Ju tuturu nkume ọzọ ka ha tua Ya. 32 Jisus zara ha, si Ọtutu ọlu ọma ka M'gosiri unu site na Nnam; n'ìhi aha ọlu gini nime ndia Ka unu nātum nkume? 33 Ndi-Ju zara Ya, si, Ọ bughi n'ihi ọlu ọma ka ayi nātu Gi nkume, kama ọ bu n'ihi nkwulu; n'ihi kwa na Gi onwe-gi, ebe I bu madu, I nēme Onwe-gi Chineke. 34 Jisus zara ha, si, Èdeghi ya n'iwu-unu, si, Mu onwem siri, Chi ka unu bu? 35 Ọ buru na Ọ kpọrọ ndi ahu chi, ndi okwu Chineke biaruru (apughi kwa imebi ihe edere n'akwukwọ nso), 36 ùnu onwe-unu nēkwu okwu bayere Onye ahu Nnam doro nsọ zite kwa n'uwa, si, I nēkwulu Chineke; n'ihi na asim, Abum Ọkpara Chineke? 37 Ọ buru na alughm ọlu Nnam, unu ekwelam. 38 Ma ọ buru na aluam ha, ọbuná ma asi na unu ekweghi Mu onwem, nēkwerenu ọlum: ka unu we mara nāmagide kwa na Nnam di nimem, na Mu onwem di kwa nime Nnam. 39 Ha we chọ kwa uzọ ijide Ya: O we pua n'aka-ha. 40 O we je ọzọ gabiga n'ofè Jọdan rue ebe Jọn nēme baptism na mbu; O we n-ogide n'ebe ahu. 41 Ọtutu madu we biakute Ya; ha nāsi kwa, N'ezie ọ dighi ihe-iriba-ama Jọn mere: ma ka ha ra, bú ihe Jọn kwuru bayere Onye a, bu ezi-okwu 42 Ọtutu madu we kwere na Ya n'ebe ahu.

Jọn 11

1 Ma aru otù nwoke adighi ike, bú Lazarọs onye Betani, onye sitere n'obodo ntà Meri na Mata nwa-nne-ya nwanyi. 2 Ma ọ bu Meri ahu nke were manu-otite te Onye-nwe-ayi, were kwa agiri-isi-ya hicha ukwu-Ya abua, onye aru nwa-nne-ya nwoke, bú Lazarọs, nādighi ike. 3 Ya mere umu-nne-ya nwanyi zigara Ya, si, Onye-nwe-ayi, le, aru nke onye ahu I huru n'anya adighi ike. 4 Ma mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si, Nriaria nka abughi nke ọnwu, kama ọ bu n'ihi otuto Chineke, ka ewe nye Ọkpara Chineke otuto site na ya. 5 Ma Jisus huru Mata, na nwa-nne-ya nwanyi, na Lazarọs, n'anya. 6 Ya mere mb͕e Ọ nuru na aru-ya adighi ike, mb͕e ahu Ọ nọgidere ubọchi abua n'ebe Ọ nọ. 7 Mb͕e ahu mb͕e nka gasiri Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Ka ayi je Judia ọzọ. 8 Ndi nēso uzọ-Ya si Ya, Rabai, ub͕u a ka ndi-Ju nāchọ uzọ itu Gi nkume; Ì nēje kwa ebe ahu ọzọ? 9 Jisus zara, si, Ọ̀ bughi oge hour iri na abua di n'ehihie? Ọ buru na onye ọ bula ejeghari n'ehihie, ọ dighi-asu ngọngọ, n'ihi na ọ nāhu ìhè nke uwa nka. 10 Ma ọ buru na onye ọ bula ejeghari n'abali, ọ nāsu ngọngọ, n'ihi na ìhè adighi nime ya. 11 Ihe ndia ka O kwuru: mb͕e nka gasiri Ọ si ha, Enyi-ayi Lazarọs adawo n'ura; ma anamaga, ka M'we kpọte ya n'ura. 12 Ya mere ndi nēso uzọ-Ya siri Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na ọ dawo n'ura, agāzọputa ya. 13 Ma Jisus kwururi okwu bayere ọnwu-ya: ma ndi ahu chère na Ọ nēkwu okwu bayere ida n'ura efu. 14 Ya mere Jisus gwawara ha okwu mb͕e ahu, si, Lazarọs nwuru anwu. 15 Anamaṅuri kwa ọṅu n'ihi unu na adighi m n'ebe ahu, ka unu we kwere; otú ọ di, ka ayi jekuru ya. 16 Ya mere Tomas, onye anākpọ Didimọs, siri ibe-ya ndi nēso Jisus, Ka ayi onwe-ayi je kwa, ka ayi we so Ya nwua. 17 Ya mere mb͕e Jisus biara, Ọ huru na ọ diwori n'ílì ubọchi anọ a. 18 Ma Betani di Jerusalem nso, ihe dika furlong iri na ise n'idi-anya; 19 ma ọtutu n'etiti ndi-Ju biakutereri Mata na Meri, ka ha we kasie ha obi n'ihi nwa-nne-ha. 20 Ya mere mb͕e Mata nuru na Jisus nābia, o je zute Ya: ma Meri nānọdu n'ulo. 21 Ya mere Mata siri Jisus, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nọri n'ebe a, nwa-nnem nwoke agaghi-anwuwori. 22 Ma ọbuná ub͕u a amataram na, ka ihe I gāriọ n'aka Chineke ra, Chineke gēnye Gi. 23 Jisus si ya, Nwa-nne-gi nwoke gēsi n'ọnwu bilie. 24 Mata si Ya, Amataram na o gēsi n'ọnwu bilie na nbilite-n'ọnwu n'ubọchi ikpe-azu. 25 Jisus siri ya, Mu onwem bu nbilite-n'ọnwu na ndu: onye nēkwere na Mu, ọbuná ma asi na ọ nwuru anwu, ọ gādi ndu ọzọ: 26 ọzọ, onye ọ bula nke nādi ndu, nke nēkwere kwa na Mu, ọ gaghi-anwu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi. I kwere nka? 27 Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi: Mu onwem ekwerewo na Gi onwe-gi bu Kraist-ayi, Ọkpara Chineke, Onye nābia n'uwa. 28 Mb͕e o kwusiri nka, o we je kpọ Meri nwa-nne-ya nwanyi na nzuzo, si, Onye-ozizí nọ n'ebe a, Ọ nāekpọ kwa gi. 29 Ma nwanyi ahu, mbe ọ nuru ya, o bilie ọsọsọ, we biakute Ya. 30 (Ma Jisus akābiarughi nime obodo ntà ahu, kama Ọ nānọ n'ebe Mata zutere Ya. ) 31 Ya mere ndi-Ju ndi ha na ya di n'ulo, ndi nākasi kwa ya obi, mb͕e ha huru Meri, na o biliri ọsọsọ we pua, ha soro ya, nēchè na ọ nējeru ílì ka o we kwa ákwá n'ebe ahu. 32 Ya mere Meri, mb͕e ọ biara n'ebe Jisus nọ, mb͕e ọ huru Ya, ọ da n'ala n'ukwu-Ya, nāsi Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nọri n'ebe a, nwa-nnem nwoke agaghi-anwuwori. 33 Ya mere mb͕e Jisus huru ya ka ọ nākwa ákwá, na ndi-Ju ndi soro ya bia ka ha nākwa kwa ákwá, Ọ su udè nime mọ-Ya, me kwa ka obi lọ Ya miri, 34 O we si, Òle ebe unu tọb͕ọworo ya? Ha si Ya, Onye-nwe-ayi, Bia, le kwa. 35 Anya-miri puru n'anya Jisus. 36 Ya mere ndi-Ju nāsi, Le otú Ọ huru ya n'anya! 37 Ma ufọdu nime ha siri, Onye a, Nke meghere anya onye ahu kpuru ìsì, Ọ̀ pughi ime kwa ka nwoke a ghara inwu anwu? 38 Ya mere Jisus nābiaru ílì ahu nāsu udè ọzọ nime Onwe-ya. Ma ọ bu ọb͕à, otù nkume nātọb͕ọ kwa n'ọnu-ya. 39 Jisus si, Wepunu nkume ahu. Mata, nwa-nne-nwanyi nke onye ahu nwuruwori, si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ nēsì ísì ub͕u a: n'ihi na nka mere ya ubọchi anọ ọ nwuru. 40 Jisus si ya, Àsighi m i na, ọ buru na i kwere, i gāhu ebube Chineke? 41 Ya mere ha wepuru nkume ahu. Ma Jisus weliri anya-Ya elu, si, Nna, ekelem I na I nuru olum. 42 Ma Mu onwem matara na I nānu olum mb͕e nile: ma n'ihi ìgwè madu a nke guzoro gburugburu ka M'kwuru ya, ka ha we kwere na ọ bu Gi onwe-gi ziterem. 43 Ma mb͕e O kwusiri ihe ndia, O were oké olu tie nkpu, si, Lazarọs, puta n'èzí. 44 Onye nwururi anwu putara, ewerewori ákwà-ozu ke ya ukwu na aka; were kwa ichafọ kechie ya iru. Jisus si ha, Tọpunu ya, ghara kwa ya ka ọ la. 45 Ya mere ọtutu n'etiti ndi-Ju, ndi biakutere Meri, ndi le-kwa-ra ihe O mere, ha kwere na Ya. 46 Ma ufọdu n'etiti ha jekuru ndi-Farisi, kọrọ ha ihe Jisus mere. 47 Ya mere ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi kpọrọ nnọkọ-ikpé ka ha zukọ, si, Gini ka ayi nēme? n'ihi na Nwoke a nēme ọtutu ihe-iriba-ama. 48 Ọ buru na ayi arapu Ya otú a, madu nile gēkwere na Ya: ndi Rom gābia kwa napu ebe nke ayi na mba nke ayi. 49 Ma otù onye n'etiti ha, bú Kaiafas, ebe ọ bu onye-isi-nchu-àjà n'arọ ahu, si ha, Unu onwe-unu amataghi ihe ọ bula, 50 unu atuleghi kwa uche na ọ bara unu urù ka otù onye nwua n'ọnọdu ndi-Ju, ka mba-ayi dum ghara ila kwa n'iyì. 51 Ma o kwughi nka site n'onwe-ya: kama ebe ọ bu onye-isi-nchu-àjà n'arọ ahu, o buru amuma na Jisus gaje inwu anwu n'ọnọdu mba ahu; 52 ọ bughi kwa nání n'ọnọdu mba ahu, kama ka O we me kwa ka umu Chineke ndi b͕asaworo zukọ n'otù. 53 Ya mere site n'ubọchi ahu ha b͕ara ìzù ka ha we b͕ue Ya. 54 Ya mere Jisus adighi-ejeghari n'iru ọra madu n'etiti ndi-Ju ọzọ, kama O si n'ebe ahu je ba n'ala nke di ọhia nso, ba n'obodo anākpọ Ifraim; O we nọgide n'ebe ahu, Ya na ndi nēso uzọ-Ya. 55 Ma ememe ngabiga nke ndi-Ju di nso: ọtutu madu we si n'ala ndi-Ju rigoro Jerusalem mb͕e ememe ngabiga ahu akērughi, ime onwe-ha ka ha di ọcha. 56 Ya mere ha nāchọ Jisus, we nēkwurita n'etiti onwe-ha, mb͕e ha guzoro n'ulo uku Chineke, si, Gini ka unu nēchè? Nà Ọ gaghi-abia n'ememe a ma-ọli? 57 Ma ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi nyereri iwu ka, ọ buru na onye ọ bula mara ebe Ọ nọ, ka o gosi ya, ha we jide Ya.

Jọn 12

1 Ya mere mb͕e ubọchi isi fọduru ka ememe ngabiga rue, Jisus biaruru Betani, ebe Lazarọs nọ, onye Jisus mere ka o si na ndi nwuru anwu bilie. 2 Ya mere ha siri Ya nri-anyasi n'ebe ahu: Mata nēje kwa ozi; ma Lazarọs bu otù onye n'etiti ndi Ya na ha nọduru na nri. 3 Ya mere Meri were manu-otite ezi nard, di oké ọnu-ahia nke-uku, nke ọtùtù-ya ruru otù pound, te ukwu Jisus abua, were kwa agiri-isi-ya hicha ukwu-Ya: ísì manu-otite ahu we juputa ulo ahu. 4 Ma Judas Iskariot, otù onye nime ndi nēso uzọ-Ya, nke gaje irara Ya nye, si, 5 N'ìhi gini ka anēreghi manu-otite a ọgu shilling iri na ise, were ya nye ndi-ob͕eye? 6 Ma nka ka o kwuru, ọ bughi n'ihi na ọ kpọrọ ndi-ob͕eye ihe; kama n'ihi na ọ bu onye-ori, na ebe o ji àkpà-ego, ọ nēwepu ihe anētiye nime ya. 7 Ya mere Jisus siri, Rapu nwanyi a ka o we debe ya rue ubọchi olìlìm. 8 N'ihi na unu nwere ndi-ob͕eye n'etiti unu mb͕e nile; ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile. 9 Ya mere ọra madu n'etiti ndi-Ju mara na Ọ nọ n'ebe ahu: ha we bia, ọ bughi n'ihi nání Jisus, kama ka ha we le kwa Lazarọs, onye Ọ mereri ka o si na ndi nwuru anwu bilie. 10 Ma ndi-isi-nchu-àjà b͕ara ìzù ka ha we b͕u kwa Lazarọs; 11 n'ihi na ọ bu n'ihi ya ka ọtutu nime ndi-Ju nāpu, nēkwere kwa na Jisus. 12 N'echi-ya oké ìgwè madu nke biara ememe ahu, mb͕e ha nuru na Jisus nābia Jerusalem, 13 ha chiri igu nkwu, pua izute Ya, we nēti nkpu, si, Hosanna: Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi, bú Eze nke Israel. 14 Ma mb͕e Jisus chọtasiri otù nwa-inyinya-ibu, Ọ nọkwasi ya; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, 15 Atula egwu, ada Zaion: le, Eze-gi nābia, nānọkwasi nwa inyinya-ibu. 16 Ihe ndia ndi nēso uzọ-Ya amaghi na mbu: kama mb͕e enyereri Jisus otuto, mb͕e ahu ka ha chetara na edereri ihe ndia bayere Ya n'akwukwọ nsọ, na ha me-kwa-ra Ya-ri ihe ndia. 17 Ya mere ìgwè madu ahu ndi ha na Ya nọ mb͕e O siri n'ílì kpọputa Lazarọs, me kwa ka o si na ndi nwuru anwu bilie, ha nāb͕a àmà. 18 Ọ bu kwa n'ihi nka ka ìgwè madu ahu puru izute Ya, n'ihi na ha nuru na O mereri ihe-iriba-ama nka. 19 Ya mere ndi-Farisi siritara onwe-ha, Lenu na okwu-unu abaghi n'ihe: le, uwa ejesowo Ya n'azu. 20 Ma ndi-Grik ufọdu di n'etiti ndi nārigo ka ha kpọ isi ala nye Chineke n'ememe ahu: 21 ya mere madu ndia biakutere Filip, nke bu onye Betsaida nke Galili, ha we kpere ya, si, Onye-nwe-ayi, ayi nāchọ ihu Jisus. 22 Filip bia gwa Andru: Andru we bia, ya na Filip, ha we gwa Jisus. 23 Jisus we za ha, si, Oge hour abiawo, ka ewe nye Nwa nke madu otuto. 24 N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na nkpuru ọka adaghi n'ala we nwua, nání ya onwe-ya nānọgide; ma ọ buru na ọ nwuru, ọ mia ọtutu nkpuru. 25 Onye nāhu ndu-ya n'anya nētufu ya; onye nākpọ kwa ndu-ya asì n'uwa nka gēdebe ya rue ndu ebighi-ebi. 26 Ọ buru na onye ọ bula nējerem ozi, ya som; ebe Mu onwem nọ kwa, n'ebe ahu ka onye nējerem ozi gānọ kwa: ọ buru na onye ọ bula nējerem ozi, ya ka Nnam gāsọpuru. 27 Ub͕u a ka nkpuru-obim nālọ miri; gini ka M'gēkwu kwa? Nna, zọputam n'oge hour nka. Ma n'ihi nka ka M'biaruru oge hour nka. 28 Nna, nye aha-Gi otuto. Ya mere otù olu sitere n'elu-igwe da, si, Enyerem ya otuto, M'gēnye kwa Ya otuto ọzọ. 29 Ya mere ìgwè madu ahu, ndi guzoro nso, ndi nu-kwa-ra ya, siri na éb͕è-elu-igwe dara: ndi ọzọ siri, Mọ-ozi agwawo Ya okwu. 30 Jisus zara, si, Ọ bughi n'ihim ka olu a daworo, kama ọ bu n'ihi unu. 31 Ub͕u a ka ikpé uwa nka di: ub͕u a ka agāchupu onye-isi uwa nka. 32 Mu onwem, ọ buru na eweliem elu site n'ala, M'gādọrọ kwa madu nile nye onwem. 33 Ma nka ka O kwuru, nēgosi aha ọnwu Ọ gaje inwu. 34 Ya mere ìgwè madu ahu zara Ya, si, Ayi onwe-ayi nuru site n'iwu-ayi na Kraist-ayi nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi: Gì onwe-gi si kwa aṅa si, Aghaghi iweli Nwa nke madu elu? Ònye bu Nwa nke madu a? 35 Ya mere Jisus siri ha, Nwa oge fọduru ka Ìhè ahu gādi n'etiti unu. Nējegharinu mb͕e unu nēnwe Ìhè ahu, ka ọchichiri ghara ijide unu: onye nējeghari n'ọchichiri adighi-amata ebe ọ nēje. 36 Mb͕e unu nēnwe Ìhè ahu, kwerenu n'Ìhè ahu, ka unu we ghọ umu Ìhè. Ihe ndia ka Jisus kwuru, O we je zonari ha Onwe-ya. 37 Ma ọ bu ezie na O mereri ọtutu ihe-iriba-ama di otú a n'iru ha, ma ha ekweghi na Ya: 38 ka okwu Aisaia onye-amuma we mezu, nke o kwuru, si, Onye-nwe-ayi, ònye kwere ihe ayi nuworo? Ogwe-aka Onye-nwe-ayi kwa, n'àru onye ka ekpugheworo ya? 39 N'ihi nka ha apughi ikwere, n'ihi na Aisaia siri ọzọ, 40 O mewo ka anya-ha kpue ìsì, O me-kwa-ra ka obi-ha me etili; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike. 41 Ihe ndia ka Aisaia kwuru, n'ihi na ọ huru ebube-Ya; o kwu-kwa-ra okwu bayere Ya. 42 Otú ọ di, ọbuná site n'etiti ndi-isi ọtutu kwere na Ya; ma n'ihi ndi-Farisi ha ekwuputaghi ya, ka aghara ichupu ha n'ulo-nzukọ: 43 n'ihi na ha huru otuto madu n'anya kari otuto Chineke. 44 Jisus we tie nkpu, si, Onye kwere na Mu, ọ bughi na Mu ka o kwere, kama ọ bu n'Onye ziterem. 45 Onye nāhum nāhu kwa Onye ziterem. 46 Mu onwem abiawo n'uwa ibu ìhè, ka onye ọ bula nke kwere na Mu we ghara inọgide n'ọchichiri. 47 Ọ buru kwa na onye ọ bula anu okwum, ghara idebe ha, Mu onwem agaghi-ekpe ya ikpé: n'ihi na abiaghm ka M'kpe uwa ikpé, kama ka M'zọputa uwa. 48 Onye nājum, nke nādighi-anara kwa okwum, o nwere onye nēkpe ya ikpé: okwu nke M'kwuru, okwu ahu gēkpe ya ikpé n'ubọchi ikpe-azu. 49 N'ihi na Mu onwem ekwughi site n'Onwem; kama Nna ziterem, Ya onwe-ya enyewom iwu, ihe M'gēkwu, na otú M'gēkwu ya. 50 Amata-kwa-ram na ihe O nyere n'iwu bu ndu ebighi-ebi: ya mere ihe Mu onwem nēkwu, dika Nnam gwaworom okwu, otú a ka M'nēkwu.

Jọn 13

1 Ma mb͕e ememe ngabiga akērughi, ebe Jisus matara na oge hour Ya abiawo ka O si n'uwa nka lakuru Nna-Ya, ebe Ọ huru ndi nke aka Ya nọ n'uwa n'anya, Ọ huru ha n'anya rue ogwugwu ihe nile. 2 Mb͕e ha nēri nri-anyasi, mb͕e ekwensu tinyesiri ub͕u a n'obi Judas Iskariot, nwa Saimon, ka ọ rara Ya nye, 3 Jisus, ebe Ọ matara na nna-Ya nyere Ya-ri ihe nile n'aka, na O si-kwa-ra n'ebe Chineke nọ puta, nālakuru kwa Chineke, 4 O bilie na nri-anyasi, wusa uwe-Ya, we chiri ákwà anēji hicha aru, we ke Onwe-ya n'úkwù. 5 Mb͕e ahu O tinye miri n'ihe anēji sa aru, we malite isa ukwu ndi nēso uzọ-Ya, na iji ákwà anēji hicha aru nke O kereri n'úkwù hicha ukwu-ha. 6 Ya mere Ọ biakute Saimon Pita. Ọ si Ya, Onye-nwe-ayi, Gì onwe-gi nāsa ukwum? 7 Jisus zara, si Ya, Ihe Mu onwem nēme, gi onwe-gi amataghi ya ub͕u a; ma i gāmara mb͕e ihe ndia gasiri. 8 Pita si Ya, I gaghi-asa ukwum ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi. Jisus zara ya, si, Ọ buru na asaghm i, Mu na gi enweghi òkè ọ bula. 9 Saimon Pita si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ bughi nání ukwum, kama akam abua kwa na isim. 10 Jisus si ya, Onye asaworo aru, nkpà isa aru ọzọ adirighi ya ma-ọbughi isa ukwu-ya, kama aru-ya dum di ọcha: unu onwe-unu di kwa ọcha, ma ọ bughi unu nile. 11 N'ihi na Ọ matara onye gaje irara Ya nye; n'ihi nka ka Ọ siri, Ọ bughi unu nile di ọcha. 12 Ya mere mb͕e Ọ sasiri ukwu-ha, chiri kwa-uwe Ya, nọdu kwa ala ọzọ, Ọ si ha, Ùnu mara ihe M'meworo unu? 13 Unu onwe-unu nākpọm, Onye-ozizí, na, Onye-nwe-ayi: unu nēkwu kwa nke-ọma; n'ihi na ọ bu otú M'di. 14 Ya mere, Ọ buru na Mu onwem, bú Onye-nwe-unu na Onye-ozizí-unu, sara ukwu-unu, unu onwe-unu nēji kwa ugwọ isarita ukwu ibe-unu. 15 N'ihi na enyewom unu ihe-nṅomi, ka unu onwe-unu we nēme kwa dika Mu onwem mere unu. 16 N'ezie, n'ezie, asim unu, Orù adighi-aka onye-nwe-ya uku; onye-ozi adighi-aka kwa onye zitere ya uku. 17 Ọ buru na unu matara ihe ndia, ngọzi nādiri unu ma asi na unu nēme ha. 18 Ekwughm okwu bayere unu nile: Mu onwem matara ndi M'rọputara: kama ọ bu ka emezu ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, Onye nēri nrim buliri ikiri-ukwu-ya imegidem. 19 Site n'ub͕u a anamagwa unu mb͕e ọ kērughi, ka unu we kwere na Mu onwem bu Ya mb͕e ọ bula ọ gēru. 20 N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nānara onye ọ bula M'gēzite, Mu ka ọ nānara; onye nānaram nānara kwa Onye ziterem. 21 Mb͕e Jisus kwusiri okwu ndia, obi lọrọ Ya miri nime mọ-Ya, O we b͕a àmà, si, N'ezie, n'ezie, asim unu, na otù onye n'etiti unu gāraram nye. 22 Ndi nēso uzọ-Ya nēlerita onwe-ha anya, nēnwe obi abua onye Ọ nēkwu okwu bayere ya. 23 Otù onye n'etiti ndi nēso uzọ-Ya nānọdu na nri nādabere n'obi Jisus, onye Jisus huru n'anya. 24 Ya mere Saimon Pita fere onye ahu isi, we si ya, Gwa ayi onye O nēkwu okwu bayere ya. 25 Onye ahu dabere, otú ọ di, n'obi Jisus, we si Ya, Onye-nwe-ayi, ònye ka ọ bu? 26 Ya mere Jisus za, si, Ọ bu onye ahu, nke Mu onwem gēsuru iberibe achicha n'ofé, nye ya. Ya mere, mb͕e O susiri iberibe achicha ahu, O were ya nye Judas, nwa Saimon Iskariot. 27 Mb͕e enyesiri ya iberibe achicha ahu, mb͕e ahu Setan batara nime onye ahu. Ya mere Jisus si ya, Ihe i nēme, me ya ọsọsọ. 28 Ma ọ dighi onye ọ bula nime ndi nọduru na nri mara ihe O ji gwa ya okwu a. 29 N'ihi na ufọdu nēchè, ebe Judas ji àkpà-ego, na Jisus siri ya, Zuta ihe di ayi nkpà n'ememe; ma-ọbu, ka o nye ndi-ob͕eye ihe. 30 Ya mere mb͕e ọ narasiri iberibe achicha ahu ọ pua ngwa ngwa: ma ọ bu abali. 31 Ya mere mb͕e ọ pururi, Jisus si, Ub͕u a ka enyere Nwa nke madu otuto, enye-kwa-ra Chineke otuto nime Ya; 32 Chineke gēnye kwa Ya otuto nime Onwe-ya, ngwa ngwa ka Ọ gēnye kwa Ya otuto. 33 Umu-ntakiri, ọ fọduru nwa oge Mu na unu gānọ. Unu gāchọm: dika M'gwa-kwa-ra ndi-Ju, si, Ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia; otú ahu ka M'nāsi unu ub͕u a. 34 Iwu ọhu M'nēnye unu, ka unu hurita ibe-unu n'anya; dika M'huru unu n'anya, ka unu onwe-unu hurita kwa ibe-unu n'anya. 35 Madu nile gēji nka mara na unu bu ndi nēso uzọm, ọ buru na unu enwerita ihu-n'anya n'ebe ibe-unu nọ. 36 Saimon Pita si Ya, Onye-nwe-ayi, Òle ebe I nāla? Jisus zara, si, Ebe M'nāla, i pughi isom ub͕u a; ma i gēsom ma emesia. 37 Pita si Ya, Onye-nwe-ayi, n'ìhi gini ka m'nāpughi iso Gi ọbuná ub͕u a? m'gātọb͕ọ ndum n'ihi Gi. 38 Jisus zara, si, Ì gātọb͕ọ ndu-gi n'ihim? N'ezie, n'ezie, asim i, Oke-ọkuku agaghi-akwa, rue mb͕e i gāgọnarim ub͕ò atọ.

Jọn 14

1 Ka obi-unu ghara ilọ miri: kwerenu na Chineke, kwere-kwa-nu na Mu. 2 N'ulo Nnam ọtutu ebe-obibi di; ọ buru na ọ bughi otú a, M'gāgwawori unu; n'ihi na anamaga idoziri unu ebe. 3 Ọ buru kwa na Mu aga idoziri unu ebe, agajem ibia ọzọ, M'gānara kwa unu nye Onwem; ka unu onwe-unu we nọ kwa ebe Mu onwem nọ. 4 Ebe Mu onwem nāla, unu mata-kwa-ra uzọ-ya. 5 Tomas si Ya, Onye-nwe-ayi, ayi amataghi ebe I nāla; àyi si aṅa mata uzọ-ya? 6 Jisus si ya, Mu onwem bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu: ọ dighi onye ọ bula nābiakute Nnam, ma-ọbughi site na Mu. 7 Ọ buru na unu maramri, unu gāmatawo-kwa-ri Nnam: site n'ub͕u a unu mara Ya, unu ahuwo kwa Ya. 8 Filip si Ya, Onye-nwe-ayi, gosi ayi Nna ahu, ọ gēzu-kwa-ra ayi. 9 Jisus si ya, Ogologo oge di otú a ka Mu na gi nọ, ma ì mataghm, Filip? onye huworom anya ahuwo Nnam anya; gì onwe-gi si aṅa si, Gosi ayi Nnam ahu? 10 Ì kweghi na Mu onwem nọ nime Nnam, Nnam nọ kwa nimem? okwu Mu onwem nāgwa unu ekwughi m n'Onwem: ma Nnam Nke nēbi nimem nālu ọlu-Ya. 11 Kwerenum na Mu onwem nọ nime Nnam, Nnam nọ kwa nimem: ma ọ bughi, kwerenum n'ihi ọlum onwe-ha. 12 N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nēkwere na Mu, ọlu Mu onwem nālu ka onye ahu gālu kwa; ọlu ka ndia uku ka ọ gālu kwa; n'ihi na Mu onwem nāgakuru Nnam. 13 Ihe ọ bula unu gāriọ kwa n'aham, ihe ahu ka M'gēme, ka ewe nye Nnam otuto nime Ọkpara-Ya. 14 Ọ buru na unu gāriọm ihe ọ bula n'aham, nke ahu ka M'gēme. 15 Ọ buru na unu nāhum n'anya, unu gēdebe ihe nile M'nyere n'iwu. 16 Mu onwem gēkpe-kwa-ra Nnam, Ọ gēnye kwa unu Onye-nkasi-obi ọzọ, ka Ọ nọyere unu rue mb͕e ebighi-ebi, 17 bú Mọ nke ezi-okwu: Onye uwa nāpughi inara; n'ihi na ọ dighi-ahu ya, ọ dighi-ama kwa Ya: unu onwe-unu mara Ya; n'ihi na Ya na unu nānọgide, Ọ gānọ kwa nime unu. 18 M'gaghi-arapu unu ka umu-nb͕ei: agajem ibiakute unu. 19 Ọ fọduru nwa oge, uwa ahukwaghm ọzọ; ma unu onwe-unu nāhum: unu onwe-unu gādi kwa ndu, n'ihi na Mu onwem nādi ndu. 20 N'ubọchi ahu unu onwe-unu gāmara na Mu onwem nọ nime Nnam, na unu onwe-unu nọ kwa nimem, na Mu onwem nọ kwa nime unu. 21 Onye nwere ihe M'nyere n'iwu, nke nēdebe kwa ha, ọ bu onye ahu nāhum n'anya: onye nāhum n'anya, Nnam gāhu kwa ya n'anya, Mu onwem gāhu kwa ya n'anya, were kwa Onwem gosi ya. 22 Judas (ọ bughi Iskariot) si Ya, Onye-nwe-ayi, Gini putaworo na I gaje iwere Onwe-gi gosi ayi, ma ọ bughi uwa? 23 Jisus zara, si ya, Ọ buru na madu ahum n'anya, ọ gēdebe okwum: Nnam gāhu kwa ya n'anya, Ayi gābiakute kwa ya, nēme kwa ebe-obibi-Ayi n'ebe ọ nọ. 24 Onye nādighi-ahum n'anya adighi-edebe okwum nile: okwu nke unu nānu abughi kwa nkem, kama ọ bu nke Nna Onye ziterem. 25 Okwu ndia ka M'gwaworo unu, mb͕e Mu na unu nānọgide. 26 Ma Onye-nkasi-obi ahu, bú Mọ Nsọ, Onye Nnam gēzite n'aham, Onye ahu gēzí unu ihe nile, me kwa ka unu cheta okwu nile Mu onwem gwara unu. 27 Udo ka M'rapuru unu; udo nkem ka M'nēnye unu: ọ bughi dika uwa nēnye ka Mu onwem nēnye unu. Ka obi-unu ghara ilọ miri, ka ọ ghara kwa itu ujọ. 28 Unu nuru na Mu onwem siri unu, Anamala, biakute kwa unu. Ọ buru na unu hurum n'anya, unu gāṅuwori ọṅu, n'ihi na anamagakuru Nnam: n'ihi na Nnam ka Mu onwem uku. 29 Ub͕u a agwawokwam unu mb͕e ọ kērughi, ka unu we kwere mb͕e ọ bula ọ gēru. 30 Ọ dighi ọtutu okwu Mu na unu gēkwu ọzọ site n'ub͕u a, n'ihi na onye-isi nke uwa nka nābia: ọ dighi kwa ihe ọ bula o nwere nimem; 31 ma ka uwa we mara na anamahu Nnam n'anya, ka ọ mara kwa na dika Nnam nyerem iwu, otú ahu ka M'nēme. Bilienu, ka ayi si n'ebe a pua.

Jọn 15

1 Mu onwem bu ezi osisi vine, Nnam bu kwa onye-ọlu-ubi. 2 Alaka ọ bula nimem nke nādighi-ami nkpuru, O wepu ya: alaka ọ bula nke nāmi nkpuru, O nēme kwa ya ka ọ di ọcha, ka o we mia nkpuru kari. 3 Ub͕u a unu onwe-unu di ọcha n'ihi okwu nke M'gwaworo unu. 4 Nọgidenu nimem, Mu onwem kwa nime unu. Dika alaka nāpughi imi nkpuru n'onwe-ya, ọ buru na ọ nọgideghi n'osisi vine; otú a ka unu onwe-unu nāpughi, ọ buru na unu anọgideghi nimem. 5 Mu onwem bu osisi vine ahu, unu onwe-unu bu alaka nkem: Onye nānọgide nimem, Mu onwem kwa nime ya, onye ahu nāmi nkpuru ri nne: n'ihi na unu apughi ime ihe ọ bula ma Mu anọghi ya. 6 Ọ buru na onye ọ bula anọgideghi nimem, atupu ya n'èzí dika alaka, ọ kpọnwu kwa; ha we chikọta ha, tubà ha n'ọku, ewe rechapu ha ọku. 7 Ọ buru na unu nānọgide nimem, ọ buru kwa na okwum nānọgide nime unu, riọnu ihe o bula unu nāchọ, agēme-kwa-ra unu ya. 8 Nime nka ka anēnye Nnam otuto, ka unu nāmi nkpuru ri nne; unu gābu kwa ndi nēso uzọm. 9 Dika Nnam hurum n'anya, Mu onwem hu-kwa-ra unu n'anya: nọgidenu nime ihu-n'anyam. 10 Ọ buru na unu edebe ihe nile M'nyere n'iwu, unu gānọgide n'ihu-n'anyam; dika Mu onwem debeworo ihe nile Nnam nyere n'iwu, nọgide kwa n'ihu-n'anya-Ya. 11 Ihe ndia ka M'gwaworo unu, ka ọṅùm we di nime unu, ka ọṅù-unu we zu kwa. 12 Nka bu ihe M'nyere n'iwu ka unu hurita ibe-unu n'anya, dika M'huru unu n'anya. 13 Ọ dighi onye ọ bula nwere ihu-n'anya kari nka uku, ka madu tọb͕ọ ndu-ya n'ihi ndi-enyì-ya. 14 Unu onwe-unu bu ndi-eyìm, ma ọ buru na unu eme ihe Mu onwem nēnye unu n'iwu. 15 Akpọkwaghm unu ndi-orù ọzọ site n'ub͕u a; n'ihi na orù adighi-amara ihe onye-nwe-ya nēme: ma akpọwom unu ndi-eyì; n'ihi na ihe nile M'nuru site n'ọnu Nnam ka M'mere ka unu mara. 16 Ọ bughi unu onwe-unu rọputaram, kama ọ bu Mu onwem rọputara unu, weputa kwa unu iche, ka unu onwe-unu we je mia nkpuru, ka nkpuru-unu we nọgide kwa: ka ihe ọ bula unu gāriọ Nnam n'aham, ka O we nye unu ya. 17 Ihe ndia ka M'nēnye unu n'iwu, ka unu we hurita ibe-unu n'anya. 18 Ọ buru na uwa akpọ unu asì, unu mara na ọ kpọwo Mu onwem asì mb͕e ọ kākpọghi unu asì. 19 Ọ buru na unu sitere n'uwa, uwa gāhu ihe nke aka ya n'anya: ma n'ihi na unu esiteghi n'uwa, kama Mu onwem rọputara unu nime uwa, n'ihi nka uwa nākpọ unu asì. 20 Chetanu okwu Mu onwem gwara unu, Orù adighi-aka onye-nwe-ya uku. Ọ buru na ha sob͕urum, ha gēsọb͕u kwa unu; ọ buru na ha debere okwum, ha gēdebe kwa nke unu. 21 Ma ihe ndia nile ka ha gēme unu n'ihi aham, n'ihi na ha amataghi Onye ziterem. 22 Ọ buru na abiaghm, ọ buru kwa na agwaghm ha okwu, ha agaghi-enwewori nmehie: ma ub͕u a ha enweghi ihe-agugọ bayere nmehie-ha. 23 Onye nākpọm asì nākpọ kwa Nnam asì. 24 Ọ buru na alughm ọlu n'etiti ha nke onye ọzọ nālughi, ha agaghi-enwewori nmhie: ma ub͕u a ha ahuwo kpọ kwa Mu na Nnam asì. 25 Ma nka mere, ka okwu edeworo n'iwu-ha we mezu, Ha kpọrọm asì n'efu. 26 Ma mb͕e ọ bula Onye-nkasi-obi ahu gābia, Onye Mu onwem gēsi n'ebe Nnam nọ zitere unu, bú Mọ nke ezi-okwu, Onye si na Nnam puta, Onye ahu gāb͕aram àmà: 27 unu onwe-unu nāb͕a kwa àmà, n'ihi na Mu na unu nọ site na mbu.

Jọn 16

1 Okwu ndia ka M'gwaworo unu, ka ewe ghara ime ka unu ma n'ọnyà. 2 Ha gāchupu unu nime ulo-nzukọ: e, oge hour nābia, ka ọ gābu na onye ọ bula nke gēb͕u unu gēchè na ọ nējere Chineke ozi. 3 Ihe ndia ka ha gēme kwa, n'ihi na ha amaghi Nnam, ha amaghi kwa Mu. 4 Ma okwu ndia ka M'gwaworo unu, ka, mb͕e ọ bula oge hour ha gābia, ka unu we cheta ha, na Mu onwem gwara unu. Ma agwaghm unu okwu ndia site na mbu, n'ihi na Mu na unu nọri. 5 Ma ub͕u a anamalakuru Onye ziterem; ọ dighi kwa onye ọ bula nime unu nājum, Òle ebe I nāla? 6 Kama n'ihi na M'gwawo unu okwu ndia, ihe-nwuta ejuputawo obi-unu. 7 Otú ọ di, Mu onwem nāgwa unu ezi-okwu; Ọ bu ihe bara unu urù ka Mu onwem la: n'ihi na asi na alaghm, Onye-nkasi-obi ahu agaghi-abiakute unu; ma ọ buru na alam, M'gēzite Ya nye unu. 8 Onye ahu, mgbe Ọ gābia, Ọ gātu kwa uwa nmehie, na ezi omume, na ikpé, n'anya: 9 nmehie, n'ihi na ha ekweghi na Mu; 10 ezi omume, n'ihi na anamalakuru Nnam, unu adighi-ahu-kwam ọzọ site n'ub͕u a; 11 ikpé, n'ihi na ekpewo onye-isi uwa nka ikpé. 12 Enwerem ọtutu ihe ọzọ igwa unu, ma unu apughi ibūru ha ub͕u a. 13 Ma mb͕e ọ bula Onye ahu gābia, bú Mọ nke ezi-okwu, Ọ gēdubà unu n'ezi-okwu nile: n'ihi na Ọ gaghi-ekwu n'Onwe-ya; kama ka ihe Ọ nānu ra, ihe ndia ka Ọ gēkwu: Ọ gākọ-kwa-ra unu ihe nile nke nābia. 14 Onye ahu gēto Mu onwem: n'ihi na Ọ gēwere n'ihe nkem, kọ-kwa-ra unu ya. 15 Ka ha ra, bú ihe nile Nnam nēnwe, bu nkem: n'ihi nka ka M'siri, na Ọ nēwere n'ihe nkem, gākọ-kwa-ra unu ya. 16 Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam, ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam. 17 Ya mere ufọdu nime ndi nēso uzọ-Ya siritara ibe-ha, Gini bu okwu a nke Ọ nāgwa ayi, si, Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam, ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam: na, N'ihi na anamalakuru Nnam? 18 Ya mere ha nāsi, Gini bu okwu a nke Ọ nēkwu, Ọ fọduru nwa oge? Ayi amataghi ihe Ọ nēkwu. 19 Jisus mara na ha nāchọ iju Ya, O we si ha, Ùnu nājurita onwe-unu ihe bayere nka, na M'siri, Ọ fọduru nwa oge, unu adighi-ahukwam ọzọ; ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge, unu gāhukwam? 20 N'ezie, n'ezie, asim unu, na unu onwe-unu gēti nkpu ákwá, kwa kwa ákwá, ma uwa gāṅuri ọṅu: ọ gēwuta unu onwe-unu, ma nwuta-unu gāghọ ọṅù. 21 Nwanyi, mb͕e ọ bula ime nēme ya, o nwere ihe-nwuta, n'ihi na oge hour ya abiawo: ma mb͕e ọ bula ọ muputara nwa, o chetaghi ahuhu-ya ọzọ, n'ihi ọṅù-ya na amuputara madu n'uwa. 22 Ya mere unu onwe-unu nēnwe kwa ihe-nwuta ub͕u a: ma M'gāhu unu ọzọ, obi-unu gāṅuri kwa ọṅu, ọ dighi kwa onye ọ bula gānara unu ọṅù-unu. 23 N'ubọchi ahu ọ dighi ihe ọ bula unu gājum. N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na unu gāriọ Nnam ihe ọ bula, Ọ gēnye unu ya n'aham. 24 Rue ub͕u a unu akāriọghi ihe ọ bula n'aham: riọnu, unu gāriọta kwa, ka ọṅù-unu we zue oke. 25 Agwawom unu ihe ndia n'ilu: oge hour nābia, mb͕e M'nāgaghi-agwa unu okwu n'ilu ọzọ, kama M'gāgwawa unu okwu bayere Nnam. 26 N'ubọchi ahu unu gāriọ n'aham: ma asighm unu, na Mu onwem gēkpere Nnam n'ihi unu; 27 n'ihi na Nnam onwe-ya nāhu unu n'anya, n'ihi na unu onwe-unu huworom n'anya, kwere kwa na Mu onwem siri n'ebe Nnam nọ puta. 28 Esirim na Nnam puta, abiawokwam n'uwa: ọzọ, anamarapu uwa, nāgakuru kwa Nnam. 29 Ndi nēso uzọ-Ya si, Le, ub͕u a I nēkwuwa okwu, I dighi-atu kwa ilu. 30 Ub͕u a ayi nāmata na I matara ihe nile, na ọ dighi kwa Gi nkpà ka onye ọ bula jua Gi: nka ka ayi ji kwere na I siri n'ebe Chineke nọ puta. 31 Jisus zara ha, si, Ọ̀ bu ub͕u a ka unu kwere? 32 Le, oge hour nābia, ọ biawo kwa, ka unu gāb͕asa, onye ọ bula ọ la na nke ya, unu gārapu kwa nání Mu: otú ọ di, nání Mu anọghi, n'ihi na Mu na Nnam nọ. 33 Okwu ndia ka M'gwaworo unu, ka unu we nwe udo nimem. N'uwa unu nēnwe nkpab͕u: ma nwenu obi-ike; Mu onwem emeriwo uwa.

Jọn 17

1 Okwu ndia ka Jisus kwuru: O we welie anya-Ya le elu-igwe, si, Nnam oge hour abiawo; nye Ọkpara-Gi otuto, ka Ọkpara-Gi we nye Gi Otuto: 2 dika I nyere Ya ike n'ebe madu nile nọ, ka ihe ọ bula I nyeworo Ya, ka O we nye ha ndu ebighi-ebi. 3 Ma nka bu ndu ebighi-ebi ahu, ka ha mara Gi, Nke nání Gi bu ezi Chineke, mara kwa Onye I zitere, bú Jisus Kraist. 4 Mu onwem nyere Gi otuto n'elu uwa, ebe M'luzuru ọlu I nyeworom ka M'lua. 5 Nna, Gi onwe-gi were kwa otuto nke M'nwere n'ebe I nọ mb͕e uwa akādighi nyem otuto ub͕u a nebe Gi onwe-Gi nọ. 6 Emerem ka aha-Gi puta ìhè nye ndi I nyerem site 'uwa: Gi onwe-gi nwere ha, I were kwa ha nyem; ha edebewo kwa okwu-Gi. 7 Ha mara ub͕u a na ihe nile, ka ha ra, bú nke I nyeworom, si n'ebe I nọ puta: 8 n'ihi na okwu I nyerem ka M'nyeworo ha; ha onwe-ha we nara ha, mara kwa n'ezie na esim n'ebe I nọ puta, ha kwere kwa na Gi onwe-gi ziterem. 9 Mu onwem nēkpe ekpere bayere ha: ọ bughi uwa ka M'nēkpe ekpere bayere ya, kama anamekpe ekpere bayere ndi I nyeworom; n'ihi na ha bu nke Gi: 10 ihe nile nke bu nkem bu kwa nke Gi, nke Gi bu kwa nkem: enyewokwam otuto nime ha. 11 Anọkwaghm n'uwa ọzọ, ma ndia nọ n'uwa, Mu onwem nābiakute kwa Gi. Nna di nsọ, nēdebe ha n'aha-Gi nke I nyeworom, ka ha we buru otù, dika Ayi onwe-ayi bu. 12 Mb͕e Mu na ha nọri, Mu onwem nēdebe ha n'aha-Gi nke I nyeworom: eche-kwa-ram ha, ọ dighi kwa onye ọ bula nime ha lara n'iyì, ma-ọbughi nwa nke ila-n'iyì ahu; ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu. 13 Ma anamabiakute Gi ub͕u a; okwu ndia ka M'nēkwu kwa nuwa, ka ha we nwe ọṅùm ka o zuworo nime onwe-ha. 14 Mu onwem enyewo ha okwu-Gi; uwa kpọ-kwa-ra ha asì, n'ihi na ha esiteghi n'uwa, dika Mu onwem nēsiteghi n'uwa. 15 Ekpeghm ekpere ka I wepu ha n'uwa, kama ka I debe ha ka ha pua n'aka ajọ onye ahu. 16 Ha esiteghi n'uwa, dika Mu onwem nēsiteghi n'uwa. 17 Were ezi-okwu do ha nsọ: okwu-Gi bu ezi-okwu. 18 Dika I zigaram nime uwa, Mu onwem ziga-kwa-ra ha nime uwa. 19 N'ihi ha ka Mu onwem nēdo kwa Onwem nsọ, ka ewe do kwa ha onwe-ha nsọ n'ezi-okwu. 20 Ọ bughi kwa nání ndia ka M'nēkpe ekpere bayere ha, kama anamekpe kwa ekpere bayere ndi kwere na Mu site n'okwu-ha; 21 ka ha nile we buru otù; dika Gi onwe-gi di nimem, dika Mu onwem di kwa nime Gi, Nna, ka ha onwe-ha we di kwa nime Ayi: ka uwa we kwere na Gi onwe-gi ziterem. 22 Otuto nke I nyeworom ka Mu onwem nyewo-kwa-ra ha; ka ha we buru otù, dika Ayi onwe-ayi bu otù; 23 Mu onwem nime ha, Gi onwe-gi kwa nimem, ka ewe me ka ha buru ndi zuworo okè ibu otù; ka uwa we mara na Gi onwe-gi ziterem, na I hu-kwa-ra ha n'anya, dika I hurum n'anya. 24 Nna, ihe I nyeworom, anamachọ ka, ebe Mu onwem nọ, ka Mu na ndi ahu nọ kwa; ka ha we hu otutom, nke I nyeworom: n'ihi na I hurum n'anya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa. 25 Nna Nke bu Onye ezi omume, uwa amaghi Gi, ma Mu onwem mara Gi; ndia ndia ma-kwara na Gi onwe-gi ziterem; 26 eme-kwa-ram ka ha mara aha-Gi, M'gēme kwa ka ha mara ya; ka ihu-n'anya I ji hum we di nime ha, Mu onwem kwa nime ha.

Jọn 18

1 Mb͕e Jisus kwusiri okwu ndia, Ọ pua, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, gabiga n'ofè iyi Kidron, ebe ubi ab͕ara ogige di, nke Ọ bàra nime ya, Ya onwe-ya na ndi nēso uzọ-Ya. 2 Ma Judas, onye nārara Ya nye, mata-kwa-ra ebe ahu: n'ihi na Jisus na ndi nēso uzọ-Ya zukọrọ n'ebe ahu ọtutu oge. 3 Ya mere Judas, ebe ọ natara òtù ndi-agha, na ndi nēje ozi site n'aka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi, ọ chiri oriọna na ọwa na ihe-agha bia n'ebe ahu. 4 Ya mere Jisus, ebe Ọ matara ihe nile nābiakwasi Ya, Ọ pua, si ha, Ònye ka unu nāchọ? 5 Ha zara Ya, si, Jisus Onye Nazaret. Jisus siri ha, Mu onwem bu Ya. Ma Judas, onye nārara Ya nye, nēguzo kwa n'etiti ha. 6 Ya mere mb͕e Ọ siri ha, Mu onwem bu Ya, ha la azu, we da n'ala. 7 Ya mere Ọ juru ha ọzọ, si, Ònye ka unu nāchọ? Ha si, Jisus Onye Nazaret. 8 Jisus zara, si, Agwaram unu na Mu onwem bu Ya: ya mere ọ buru na unu nāchọm, ka ndia la: 9 ka okwu O kwuru we mezu, si, N'etiti ndi I nyeworom ọ dighi onye ọ bula M'tufuru. 10 Ya mere Saimon Pita, ebe o ji mma-agha, ọ miputa ya, b͕ue orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti aka-nri ya. Ma aha orù ahu bu Malkọs. 11 Ya mere Jisus siri Pita, Miye mma-agha-gi n'ọbọ-ya: iko nke Nnam nyeworom, M'gaghi-aṅu ya? 12 Ya mere òtù ndi-agha ahu na ọchi-agha, na ndi nējere ndi-Ju ozi, jidere Jisus ke kwa Ya ab͕u, 13 we buru uzọ duru Ya jekuru Anas; n'ihi na ya bu nna nwunye Kaiafas, onye bu onye-isi-nchu-àjà arọ ahu. 14 Ma Kaiafas bu onye ahu nke dururi ndi-Ju ọdú, na ọ bara urù ka otù onye nwua n'ọnọdu ndi-Ju. 15 Saimon Pita we so Jisus, ya na onye ọzọ nke nēso uzọ Jisus. Ma onye ahu nke nēso uzọ Jisus bu onye onye-isi-nchu-aja mara, o we so Jisus ba n'obí onye-isi-nchu-àjà; 16 ma Pita nēguzo n'èzí n'ọnu-uzọ. Ya mere onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus, onye onye-isi-nchu-àjà mara, we pua gwa nwanyi nke nēche ọnu-uzọ okwu, we dubata Pita. 17 Ya mere nwa-ab͕ọghọ ahu nke nēche ọnu-uzọ si Pita, Ọ̀ gābu na gi onwe-gi bu kwa otù onye n'etiti ndi nēso uzọ Nwoke a? Pita si, Abughi m. 18 Ma ndi-orù na ndi nēje ozi guzoro n'ebe ahu, ebe ha funwusiri ọku icheku; n'ihi na oyi nātu; ha nānya kwa ọku: Pita nọ kwa n'etiti ha, nēguzo nānya kwa ọku. 19 Ya mere onye-isi-nchu-àjà juru Jisus ajuju bayere ndi nēso uzọ-Ya, na ajuju bayere ozizí-Ya. 20 Jisus zara ya, si, Mu onwem agwawawo uwa okwu; Mu onwem zíri ihe mb͕e nile n'ulo-nzukọ, na n'ulo uku Chineke, ebe ndi-Ju nile nāb͕akọ; ekwukwaghi m ihe ọ bula na nzuzo. 21 Gini mere i nāju Mu onwem? jua ndi nuworo okwum, ihe M'gwara ha: le, ndia matara ihe nile Mu onwem kwuru. 22 Ma mb͕e O kwusiri okwu ndia, otù onye nime ndi nēje ozi nke nēguzo nso we pia Jisus ihe, si, Ì nāza onye-isi-nchu-àjà otú a? 23 Jisus zara ya, si, Ọ buru na M'kwuru nke-ọjọ, b͕ara ihe ọjọ ahu àmà: ma ọ buru nke-ọma, gini mere i nētim aka? 24 Ya mere Anas zigara Ya n'ab͕u jekuru Kaiafas onye-isi-nchu-àjà. 25 Ma Saimon Pita nēguzo nānya kwa ọku. Ya mere ha siri ya, Ọ̀ gābu na gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ndi nēso uzọ-Ya? Onye ahu gọrọ, si, Abughi m. 26 Otù onye nime ndi-orù onye-isi-nchu-àjà, buri onye-ikwu nke onye ahu Pita bipuru nti-ya, si, Mù onwem ahughi gi na Ya n'ubi ahu ab͕ara ogige? 27 Ya mere Pita gọ-kwa-ra ọzọ: ngwa ngwa oke-ọkuku we kwa. 28 Ya mere ha si na nke Kaiafas duru Jisus ba na Pritoriọm: ọ bu kwa n'isi-ututu; ma ha onwe-ha abàghi nime Pritoriọm ahu, ka aghara imeru ha, kama ka ha we rie oriri ngabiga. 29 Ya mere Pailat pukuru ha n'èzí, si, Ọ̀ bu ebubo gini ka unu nēbo Nwoke a? 30 Ha zara, si ya, Ọ buru na Onye a abughi onye nēme ihe ọjọ, ayi agaghi-ararawori Ya nye n'aka-gi. 31 Ya mere Pailat siri ha, Unu onwe-unu were Ya, kpe-kwa-nu Ya ikpé dika iwu-unu si di. Ndi-Ju siri ya, O zighi ayi ezi n'iwu ib͕u onye ọ bula: 32 ka okwu Jisus we mezu, nke O kwuru, nēgosi aha ọnwu Ọ gajē inwu. 33 Ya mere Pailat bà-kwa-ra ọzọ nime Pritoriọm, we kpọ Jisus, si Ya, Gì onwe-gi bu Eze ndi-Ju? 34 Jisus zara, si, Gì onwe-gi nēkwu nka n'onwe-gi, ma-ọbu na ndi ọzọ gwara gi okwu bayerem? 35 Pailat zara, si, Mù onwem bu onye-Ju? Mba nke Gi na ndi-isi-nchu-àjà rara Gi nye n'akam: gini ka I mere? 36 Jisus zara, si, Ala-ezem esiteghi n'uwa nka: ọ buru na ala-ezem sitere n'uwa nka, ndi nējerem ozi gālu ọ̀gù, ka aghara iraram nye n'aka ndi-Ju: ma ub͕u a ala-ezem esighi n'ebe a puta. 37 Ya mere Pailat siri Ya, Gì onwe-gi bu kwa eze? Jisus zara, si, Gi onwe-gi nāsi na Mu onwem bu eze. Amuwo Mu onwem ime ihe a, abiawokwam nime uwa ime ihe a, ka M'we b͕ara ezi-okwu àmà. Onye ọ bula nke sitere n'ezi-okwu ahu nānu olum. 38 Pailat si Ya, Gini bu ezi-okwu? Mb͕e o kwusiri nka, o we pukuru ndi-Ju ọzọ, si ha, Mu onwem ahughi ihe kwesiri ahuhu-nmehie nime Ya. 39 Ma unu nwere ome-n'ala, ka m'rapuru unu otù onye n'ememe ngabiga: ùnu nēzube kwa ka M'rapuru unu Eze ndi-Ju? 40 Ya mere ha tiri nkpu ọzọ, si, Ọ bughi Onye a, kama ọ bu Barabas. Ma Barabas bu onye nāpunara madu ihe.

Jọn 19

1 Ya mere mb͕e ahu Pailat were Jisus, pia Ya ihe. 2 Ndi-agha we kpa okpu-eze nke eji ogwu me, ha were ya kpube Ya n'isi, were kwa uwe odobo b͕okwasi Ya; 3 ha we nābiakute Ya, nāsi, Ekele, Eze ndi-Ju! ha nāpia kwa Ya ihe. 4 Pailat we pu kwa ọzọ n'èzí, si ha, Le, anamekuputa Ya n'èzí nye unu, ka unu we mara na ahughim ihe kwesiri ahuhu-nmehie nime Ya. 5 Ya mere Jisus putara n'èzí, nēkpu okpu-eze ahu nke eji ogwu me, nēyi kwa uwe odobo ahu. Pailat we si ha, Le, Nwoke ahu! 6 Ya mere mb͕e ndi-isi-nchu-àjà na ndi nēje ozi huru Ya, ha tie nkpu, si, Kpọgide Ya n'obe, kpọgide Ya n'obe. Pailat si ha, Unu onwe-unu were Ya, kpọgide kwa Ya n'obe: n'ihi na mu onwem ahughi ihe kwesiri ahuhu-nmhie nime Ya. 7 Ndi-Ju zara ya, si, Ayi onwe-ayi nwere iwu, ma dika iwu ahu si di O kwesiri inwu ọnwu, n'ihi na O mere Onwe-ya Ọkpara Chineke. 8 Ya mere mb͕e Pailat nuru okwu a, ọ tukariri egwu; 9 o we ba nime Pritoriọm ọzọ, we si Jisus, Òle ebe Gi onwe-gi si bia? ma ọ dighi ọziza Jisus zara ya. 10 Ya mere Pailat si Ya, Ì dighi-agwam okwu? Ì mataghi na m'nwere ike irapu Gi, m'nwe-kwa-ra ike ikpọgide Gi n'obe? 11 Jisus zara ya, si, I gaghi-enwe ike ọ bula imegidem, ọ buru na esighi n'elu nye gi ya-ri: n'ihi nka onye raram nye n'aka-gi nwere nmehie kari. 12 Site na nka Pailat nāchọ uzọ irapu Ya: ma ndi-Ju tiri nkpu, si, Ọ buru na i rapu Onye a, i bughi eyì Sisa: onye ọ bula nke nēme onwe-ya eze nēkwu okwu imegide Sisa. 13 Ya mere mb͕e Pailat nuru okwu ndia, o duputa Jisus n'èzí, we nọkwasi oche-ikpé n'ebe anākpọ Pavement, ma n'asusu Hibru, Gabata. 14 Ma ọ bu ubọchi Nkwadebe nke ememe ngabiga: ọ di ka oge hour nke-isi. O we si ndi-Ju, Le, Eze-unu! 15 Ya mere ndi ahu tiri nkpu, si, Wepu Ya, wepu Ya, kpọgide Ya n'obe. Pailat si ha, M'gākpọgide Eze-unu n'obe? Ndi-isi-nchu-àjà zara, si, Ayi enweghi eze ma-ọbughi Sisa. 16 Ya mere mb͕e ahu ọ rara Ya nye n'aka-ha, ka ewe kpọgide Ya n'obe. 17 Ya mere ha kuru Jisus tiyere onwe-ha: O we pua, nēbu obe-Ya n'Onwe-ya, ga rue ebe anākpọ Ebe okpokoro-isi, nke anākpọ n'asusu Hibru Gọlgọta: 18 ebe ha kpọgidere Ya n'obe, Ya na ndikom abua ọzọ, otù n'akuku a otù n'akuku ọzọ, Jisus nọ kwa n'etiti ha. 19 Pailat we de kwa ihe-ndekwasi, debe ya n'elu obe-Ya. Ma ihe edeworo bu, Jisus ONYE NAZARET EZE NDI-JU. 20 Ya mere ọtutu n'etiti ndi-Ju guru ihe-ndekwasi ahu: n'ihi na ebe akpọgidere Jisus n'obe di obodo Jerusalem nso: ede-kwa-ra ya n'asusu Hibru, n'asusu Latin, n'asusu Grik. 21 Ya mere ndi-isi-nchu-àjà nke ndi-Ju si Pailat, Edela, Eze ndi-Ju; kama, na Onye ahu siri, Abum Eze ndi-Ju. 22 Pailat zara, si, Ihe m'deworo, edewom ya. 23 Ya mere ndi-agha, mb͕e ha kpọgidesiri Jisus n'obe, ha chiri uwe-Ya, kè ha òkè anọ, otù onye otù òkè otù onye otù òkè; ha chi-kwa-ra uwe-ime-Ya: ma uwe-ime ahu enweghi ọb͕ub͕a, akpara ya site n'elu we gazu n'aru uwe-ime ahu dum. 24 Ya mere ha siritara onwe-ha, Ka ayi ghara idọwa ya, kama ka ayi fere ya nzà, onye ọ gābu nke ya: ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezue, nke si, Ha kère uwem nye onwe-ha, N'elu ihe m'nēyi n'aru ka ha fe-kwa-ra nzà. Ya mere ndi-agha ahu mere ihe ndia. 25 Ma nne-Ya, na nwa-nne nne-Ya nke nwayi, Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalini, nēguzo obe Jisus nso. 26 Ya mere mb͕e Jisus huru nne-Ya, na onye ahu nke nēso uzọ-Ya, onye Ọ huru n'anya, ka o nēguzo nso, Ọ si nne-Ya, Nwanyi, le, nwa-gi nwoke! 27 Mb͕e ahu Ọ si onye ahu nke nēso uzọ-Ya, Le, nne-gi! Site n'oge hour ahu onye ahu nke nēso uzọ-Ya we kuru ya la n'ulo nke aka ya. 28 Mb͕e ihe a gasri, Jisus, ebe Ọ matara na ihe nile agwuwo ub͕u a, ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu, Ọ si, Akpiri nākpọm nku. 29 Adọbara n'ebe ahu ite nke manya-vine b͕ara uka juru: ya mere ha were sponge nke manya-vine ahu b͕ara uka juru tukwasi n'elu osisi hyssop, che Ya n'ọnu. 30 Ya mere mb͕e Jisus narasiri manya-vine ahu nke b͕ara uka, Ọ siri, Ọ gwuwo O we rube isi, rara mọ-Ya nye. 31 Ya mere ndi-Ju, ebe ọ bu ubọchi Nkwadebe, ka aru-ha we ghara idigide n'elu obe n'ubọchi-izu-ike (n'ihi na ubọchi-izu-ike nke ízù ahu bu oké ubọchi), ha kpere Pailat ka etijie ogwe-ukwu-ha, ka ebupu kwa ha. 32 Ya mere ndi-agha biara, tijie ogwe-ukwu nke onye mbu, na nke onye ọzọ, nke akpọgidere Ya na ya n'obe: 33 ma mb͕e ha biaruru Jisus, hu kwa na Ọ nwuwori ub͕u a, ha etijighi ogwe-ukwu-Ya: 34 otú ọ di, otù onye n'etiti ndi-agha were ube ma Ya n'akuku, ngwa ngwa ọbara na miri we puta. 35 Onye huworo ya ab͕awo kwa àmà, àmà-ya bu kwa ezie: onye ahu nāmata kwa na o nēkwu ezi-okwu, ka unu onwe-unu we kwere kwa. 36 N'ihi na ihe ndia mere, ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu, Agaghi-etiji otù ọkpukpu-Ya. 37 Ọzọ kwa, ihe ọzọ di iche edeworo n'akwukwọ nsọ si, Ha gēlegide Onye ahu Nke ha mapúru amapú. 38 Ma mb͕e ihe ndia gasiri, Josef nke Arimatia, ebe o nēso uzọ Jisus, ma na nzuzo n'ihi egwu ndi-Ju, o kpere Pailat ka o bupu aru Jisus: Pailat we kwere ya. Ya mere ọ biara, bupu aru-Ya. 39 Nikọdimọs, onye biakutere Ya n'abali na mbu, bia-kwa-ra, nēweta myrrh na aloes agwara, ihe ra ka ọgu pound ise n'ọtùtù. 40 Ya mere ha were aru Jisus, ke ya n'ezi ákwà-ozu, ya na udá utọ ndia, dika ndi-Ju nēme n'ilì ozu. 41 Ma n'ebe akpọgidere Ya N'obe otù ubi ab͕ara ogige di; nime ubi ab͕ara ogige ahu ílì ọhu di kwa nke akātọb͕ọghi madu ọ bula nime ya. 42 Ya mere n'ebe ahu, n'ihi ubọchi Nkwadebe nke ndi-Ju, (n'ihi na ílì ahu di nso), ka ha tọb͕ọrọ Jisus.

Jọn 20

1 Ma n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa n'isi-ututu, mb͕e chi akābọghi, Meri Magdalini biaruru ílì ahu, we hu nkume-ya na ewepuwo ya n'ílì. 2 Ya mere ọ b͕a ọsọ, biakute Saimon Pita, biakute kwa onye ọzọ ahu nēso uzọ Jisus, onye Jisus huru n'anya, si ha, Ha ebupuwo Onye-nwe-ayi n'ílì, ayi amataghi kwa ebe ha tọb͕orọ Ya. 3 Ya mere Pita puru, ya na onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus, ha we nēje iru ílì ahu. 4 Ha abua we b͕a ọsọ n'otù: onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus we b͕a kari Pita, buru uzọ biarue ílì ahu; 5 o we ruru ala nyo nime ya, hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ; otú ọ di, ọ bàghi nime. 6 Ya mere Saimon Pita bia kwa nēso ya, o we ba nime ílì ahu; o we hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ, 7 ichafọ kwa, nke diri n'isi-Ya, ya na ezi ákwà-ozu ahu atọb͕ọghi n'otù ebe, kama aturuworo ya debe n'otù ebe di iche. 8 Ya mere mb͕e ahu onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus, onye buru uzọ biarue ílì, bà-kwa-ra nime, o we hu, kwere kwa. 9 N'ihi na ha akāmataghi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, na Ọ ghaghi isi na ndi nwuru anwu bilie. 10 Ya mere ndi ahu ndi nēso uzọ Jisus laghachiri ọzọ n'ulo nke aka ha. 11 Ma Meri nēguzo n'èzí na nso ílì ahu nākwa ákwá: ya mere, ka ọ nākwa, o ruru ala nyo nime ílì; 12 o we hu ndi-mọ-ozi abua nēyi uwe ọcha ka ha nọduru ala, otù n'isi, otù kwa n'ukwu, n'ebe atọb͕ọrọri aru Jisus. 13 Ndi ahu we si ya, Nwanyi, gini mere i nākwa ákwá? Ọ si ha, N'ihi na ha bupuru Onye-nwem, amatakwaghm ebe ha tọb͕ọrọ Ya. 14 Mb͕e o kwusiri okwu ndia, o chigharia, we hu Jisus ka O guzoro, ma ọ mataghi na ọ bu Jisus. 15 Jisus si ya, Nwanyi, gini mere i nākwa ákwá? ònye ka i nāchọ? Nwanyi ahu, ebe ọ nēchè na Ọ bu onye-nche ubi ahu ab͕ara ogige, ọ si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na Gi onwe-gi bupuru Ya, gwam ebe I tọb͕ọrọ Ya, mu onwem gēbupu kwa ya. 16 Jisus si ya, Meri. Nwayi ahu chigharia, si Ya n'asusu Hibru, Rabonai; nke bu, Onye-ozizí. 17 Jisus si ya, Emetulam aka; n'ihi na akāmarigogh lakuru Nnam: ma gakwuru umu-nnam, si ha, Anamarigo lakuru Nnam na Nna-unu, na Chinekem na Chineke-unu. 18 Meri Magdalini bia kọrọ ndi nēso uzọ-Ya, si, Ahuwom Onye-nwe-ayi; ọkọ-kwa-ra ha otú Ọ gwara ya-ri ihe ndia. 19 Ya mere mb͕e o ruru anyasi, n'ubọchi ahu, bú ubọchi mbu n'ízù, mb͕e emechi-kwa-ra uzọ nile ebe ndi nēso uzọ-Ya nọ, n'ihi egwu ndi-Ju, Jisus biara guzo n'etiti, si ha, Udo diri unu. 20 Mb͕e O kwusiri nka, O gosi ha aka-Ya abua na akuku-Ya. Ya mere ndi nēso uzọ-Ya ṅuriri ọṅu, mb͕e ha huru Onye-nwe-ayi. 21 Ya mere Jisus siri ha ọzọ, Udo diri unu: dika Nnam ziteworom, otú a ka Mu onwem nēziga kwa unu. 22 Mgbe, ahu o kusa ha ume, si ha, Naranu Mọ Nsọ: 23 ndi nile ọ bula unu nāb͕aghara nmehie-ha, ab͕agharawo ha nye ha; ndi nile ọ bula unu nējide nmehie-ha, ejidewo nmehie-ha. 24 Ma Tomas, nke anākpọ Didimọs, otù onye nime ndi-ozi iri na abua ahu, anọghi n'etiti ha mb͕e Jisus biara. 25 Ya mere ndi ọzọ nēso uzọ Jisus si ya, Ayi ahuwo Onye-nwe-ayi. Ma ọ siri ha, Ọ buru na ahughm n'aka-Ya abua apa ǹtú, tiye kwa nkpisi-akam n'apa ǹtú ahu, tiye kwa akam n'akuku-Ya, m'gaghi-ekwe ma-ọli. 26 Mb͕e ubọchi asatọ ọzọ gasiri ndi nēso uzọ Jisus we nọ nime ulo, Tomas nọ kwa n'etiti ha. Jisus bia, mb͕e emechiri uzọ nile, O guzo n'etiti ha, si, Udo diri unu. 27 Mb͕e ahu Ọ si Tomas, Setipu nkpisi-aka-gi n'ebe a, le akam abua; setipu kwa aka-gi, tiye nime akukum: aghọ-kwa-la onye nēkweghi, kama ghọ onye nēkwere. 28 Tomas zara, si Ya, Onye-nwem na Chinekem. 29 Jisus si ya, N'ihi na i huwom, ì kwerewo? ngọzi nādiri ndi akāhughi, ma ha kwere. 30 Ya mere ọtutu ihe-iriba-ama ọzọ ka Jisus mere n'iru ndi nēso uzọ-Ya, nke anēdeghi n'akwukwọ a: 31 ma edewo ihe ndia n'akwukwọ, ka unu we kwere na Jisus bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke; ka unu we nwe kwa ndu n'aha-Ya n'ihi na unu kwere.

Jọn 21

1 Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus mere Onwe-ya ka Ọ puta ìhè ọzọ nye ndi nēso uzọ-Ya n'oké osimiri Taibirias; ma O mere Onwe-ya ka Ọ puta ìhè otú a. 2 Saimon Pita, na Tomas anākpọ Didimọs, na Nataniel, bú onye Kena nke Galili, na umu nke Zebedi, na madu abua ọzọ nime ndi nēso uzọ-Ya, nọkọrọ n'otù ebe. 3 Saimon Pita si ha, Anamaga ib͕u azù. Ha si ya, Ayi onwe-ayi gēso kwa gi je. Ha puru, ba n'ub͕ọ-ha; ma n'abali ahu ha egbughi ihe ọ bula. 4 Ma mb͕e chi nābọ ub͕u a, Jisus guzoro n'ótú: otú ọ di, ndi nēso uzọ-Ya amataghi na ọ bu Jisus. 5 Ya mere Jisus si ha, Umu-ntakiri, ùnu ji ihe-oriri ọ bula? Ha zara Ya, si, É-è. 6 O we si ha, Wuyenu ihe unu ji eb͕u azù n'akuku aka-nri nke ub͕ọ, unu gāhu kwa. Ya mere ha wuyere ya, ma ub͕u a ha enweghi ike idọ ya n'ihi ọtutu azù di ya. 7 Ya mere onye ahu nke nēso uzọ-Ya onye Jisus huru n'anya siri Pita, Ọ bu Onye-nwe-ayi. Ya mere mb͕e Saimon Pita nuru na ọ bu Onye-nwe-ayi, o b͕okwasi uwe uku ya (n'ihi na ọ b͕ara ọtọ), we tubà onwe-ya nime oké osimiri. 8 Ma ndi ọzọ ndi nēso uzọ Jisus biara n'ub͕ọ ntà ha (n'ihi na ha anọghi n'ebe di anya n'ala, kama ihe ra ka ọgu cubit iri), nādọ ihe ha ji eb͕u azù nke azù juru nime ya. 9 Ya mere mb͕e ha ridara n'ala, ha hu ọku icheku n'ebe ahu, na azù atukwasiri ya, na ob͕e achicha. 10 Jisus si ha, Wetanu ufọdu nime azù unu b͕uru ub͕u a. 11 Ya mere Saimon Pita rigoro, dọrọ ihe ha ji eb͕u azù bia n'ala, nke oké azù juru nime ya, ọgu azù asa na iri na atọ: ma ọ bu ezie na azù di ọtutu otú a, ma ihe ha ji eb͕u azù adọkaghi. 12 Jisus si ha, Bianu, rie nri-ututu. Ma ọ dighi onye ọ bula nime ndi nēso uzọ-Ya nwere anya-ike iju Ya, si, Gì onwe-gi bu onye? n'ihi na ha matara na ọ bu Onye-nwe-ayi. 13 Jisus bia, were achicha ahu, nye ha, azù ahu kwa otú ahu. 14 Nka mere ya ub͕ò atọ emere ka Jisus puta ìhè nye ndi nēso uzọ-Ya, mb͕e emesiri ka O si na ndi nwuru anwu bilie. 15 Ya mere mb͕e ha risiri nri-ututu-ha, Jisus si Saimon Pita, Saimon, nwa Jọn, ì hurum n'anya kari ndia? Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyìm. Ọ si ya, Nēnye umu-aturum nri. 16 Ọ si ya ọzọ nke ub͕ò abua, Saimon, nwa Jọn, ì hurum n'anya? Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyìm. Ọ si ya, Nāzù aturum. 17 Ọ si ya nke ub͕ò atọ, Saimon, nwa Jọn, àbum eyì-gi? O wutara Pita na Ọ siri ya nke ub͕ò atọ, Àbum eyì-gi? O we si Ya, Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi matara ihe nile; Gi onwe-gi mara na I bu eyìm. Jisus si ya, Nēnye aturum nri. 18 N'ezie, n'ezie, asim i, Mb͕e i di n'okorọbia, i nēke onwe-gi ihe-ọkiké n'úkwù, nējeghari kwa ebe i nāchọ: ma mb͕e i gēme agadi, i gēseti aka-gi abua, onye ọzọ gēke gi ihe-ọkiké n'úkwù, būru kwa gi ga ebe i nāchọghi. 19 Ma nka ka O kwuru, nēgosi aha ọnwu ọ gēji nye Chineke otuto. Mb͕e O kwusiri nka, Ọ si ya, Som. 20 Pita we chigharia, hu onye ahu nke nēso uzọ-Ya, onye Jisus huru n'anya, ka o nēso; onye nādabere kwa n'obi-Ya na nri-anyasi ahu, si, Onye-nwe-ayi, ònye bu onye ahu nke nārara Gi nye? 21 Ya mere Pita, mb͕e ọ huru ya, ọ si Jisus, Onye-nwe-ayi, ma onye a, gini gēme ya? 22 Jisus si ya, Ọ buru na anamachọ ka ọ nọgide rue mb͕e M'gābia, ọ̀ bu gini n'ebe i nọ? gi onwe-gi som. 23 Ya mere okwu a putara n'etiti umu-nna nime Kraist, na onye ahu nke nēso uzọ-Ya agaghi-anwu: ma Jisus asighi ya, na ọ gaghi-anwu; kama, Ọ buru na anamachọ ka ọ nọgide rue mb͕e M'gābia, ọ̀ bu gini n'ebe i nọ? 24 Nka bu onye ahu nēso uzọ Jisus nke nāb͕ara ihe ndia àmà, nke de-kwa-ra ihe ndia n'akwukwọ: ayi mata-kwa-ra na àmà-ya bu ezie. 25 Ma ọtutu ihe ọzọ nke Jisus mere di kwa, nke, ma ọ buru na edere ha n'akwukwọ n'otù n'otù, ọ dim ka ọbuná uwa onwe-ya agaghi-anagide akwukwọ agēde.





AMAZING GRACE BIBLE INSTITUTE